Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu, Nke nēguzoghi kwa n'uzọ ndi nmehie, Nke nānọghi kwa n'ọnọdu ndi nākwa emò.
Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;
Otú a ka Jehova siri ndi nka, Ọbuná otú a ka ha huworo nwaghari n'anya; ha eb͕ochighi ukwu-ha: ihe-ha atọghi kwa Jehova utọ; ub͕u a ka Ọ nēcheta ajọ omume-ha, were nmehie-ha leta ha.