Nebukadreza, bú eze Babilon, eripiawom, o kpochapuwom, o mewom ka m'ghọ aria nke ihe nādighi, o lowom dika ogologo anu-miri, o mejuwo afọ-ya n'ihe-utọm nile, ọ chupuwom.
Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi; Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya; N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.
Onye-nwe-ayi adiwo ka onye-iro, Ọ lodawo Israel; O lodawo ulo-elu-ya nile, O bibiwo ebe-Ya nile ewusiri ike: O me ka ize-ume na isu-ude ba uba n'ada Juda.