Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 9:11 - Bible Nso

11 Efraim, dika anu-ufe ka nsọpuru-ha gēfepu: ọmumu-nwa na idi-ime na itu-ime ewe ghara idi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ, nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 9:11
18 Iomraidhean Croise  

Aha nke-abua ka ọ kpọrọ Efraim: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'mua ọmùmù n'ala ewedaram ala.


Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu, Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi; Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi.


Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, o nweghi nwa rue ubọchi ọnwu-ya.


Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu, Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.


Ka ha di ka ejula nāga nāb͕aze, Dika nwa nwanyi mukworo amukwo, dika ndi ọ dighi mb͕e ha huru anyanwu.


Ọ buru na nwoke amuta ọgu umu ise, di kwa ndu ọtutu arọ, ubọchi nke arọ-ya ewe ba uba, ma afọ adighi-eju nkpuru-obi-ya n'ezi ihe, ọzọ kwa, ọ dighi olìlì diri ya; asiwom, na nwa amukworo amukwo di nma kari ya:


Ebe ewusiri ike gāgwupu n'Efraim, ala-eze gāgwupu kwa na Damaskọs, ya na ndi Siria fọduru; dika nsọpuru umu Israel ka ha gādi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.


Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n'ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n'ihi nsọpuru-ya, n'ihi na o siwo n'ebe ọ nọ je biri n'ala ọzọ.


Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M'gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere.


Efraim gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'ubọchi iba-nba: n'etiti ebo nile nke Israel ka M'meworo ka amara ihe kwesiri ntukwasi-obi.


Nye ha, Jehova: gini ka I gēnye? nye ha afọ nēmebi ime na ara kpọrọ nku.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke umu Amon, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi; n'ihi na ha ab͕awawo ndinyom Gilead di ime afọ ka ha we me ka ókè-ala-ha sa mbara:


N'ihi na le, ubọchi nābia, mb͕e ha gāsi, Ngọzi nādiri ndinyom àgà, na afọ nke nāmughi nwa, na ara nke nāzùghi nwa.


Ihe anābu ọnu ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi.


na n'aru ichi-ya nke nēsi apata ukwu-ya puta, na n'aru umu-ya nke ọ nāmu; n'ihi na ọ gēri ha na nzuzo n'ukọ ihe nile: nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.


Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan