Nání nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie, Jihu ewezugaghi onwe-ya n'iso ha, bú umu-ehi ọla-edo ahu nke di na Bet-el, na nke di na Dan.
Ndi-isi-ya nēkpe ikpe n'ihi iri-ngo, ndi-nchu-àjà-ya nēzí ihe n'ihi ugwọ, ndi-amuma-ya nāju ase n'ihi ego: ma na Jehova ka ha nādabere, si, Jehova, Ọ̀ nọghi n'etiti ayi? ihe ọjọ agaghi-abiakwasi ayi.
Mb͕e Nna-nwe-ulo gēbiliwori, mechi kwa uzọ-Ya, unu we malite iguzo n'èzí, na iku aka n'ọnu-uzọ ahu, si Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ; ma Ọ gāza, si unu, Amataghim unu, ebe unu si bia;
Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.