Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 8:14 - Bible Nso

14 Israel echezọwo kwa Onye ahu Nke meworo ya, o we wue ulo uku di iche iche; Juda emewo kwa ka obodo ewusiri ike ba uba: ma M'gēzite ọku n'obodo-ya nile, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Izrel echezọọla Onye kere ha ma wukwaa obi ndị eze dị iche iche. Juda ewukwaala obodo dị iche iche e wusiri ike. Nʼihi ya, aga m ezite ọkụ nʼobodo ha niile, ọkụ ga-erepịa obodo ha niile e wusiri ike.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 8:14
31 Iomraidhean Croise  

O me ulo nke ebe di elu, me kwa ndi-nchu-àjà sitere n'ọnu-ọgugu ndi Israel nile, ndi nēsiteghi n'umu Livai.


O rue, dika agāsi na ọ bu ihe nfe na ọ nējeghari na nmehie nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na ọ luru Jezebel na nwunye, bú nwa-nwayi Etbeal eze ndi Zaidon, ọ we je fè Beal òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ya.


Ma n'arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha.


O wu-kwa-ra ulo-elu ufọdu n'ọzara, gwue ọtutu olùlù-miri, n'ihi na o nwere ọtutu anu-ulo; ma n'ebe di ala ala, ma n'ebe di lari: o nwe-kwa-ra ndi-ọlu-ubi na ndi-ọlu-ubi-vine n'ugwu na nime Kamel; n'ihi na ọ bu onye huru ọlu ubi n'anya.


O wu-kwa-ra obodo ufọdu n'ugwu Juda, wu kwa ulo uku na ulo-elu n'oké ọhia.


Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha, Onye nēmeri ihe uku di iche iche n'Ijipt;


Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala; Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi:


N'ihi na i chezọwo Chineke nke nzọputa-gi, na n'ihi na i chetaghi oké nkume ahu, bú ebe-gi siri ike; n'ihi nka ka i nāku ihe-ọkuku di iche iche nke di utọ, ọ bu kwa alaka osisi vine nke ala ọzọ ka i nāma nime ya:


Ma mb͕e ọ nāhu umu-ya, bú ọlu akam abua, n'etiti ya, ha gēdo aham nsọ; e, ha gēdo Onye Nsọ nke Jekob nsọ, ọ bu kwa n'iru Chineke nke Israel ka ha gāma jijiji.


Jehova gāputa dika dike; dika onye-agha ka Ọ gākpọte ekworo: Ọ gēti nkpu agha, e, Ọ gēti oké nkpu agha; n'imegide ndi-iro-Ya ka Ọ nēme Onwe-ya dike.


O we wukwasi ya ọnuma nke iwe-Ya, na ike nke agha; nke ahu we suye ya ọku buruburu, ma ọ maghi; o we re ya ọku, ma ọ dighi-atughari obi-ya na ya.


ndi M'kpuworo nye Onwem, akukọ otutom ka ha gākọ.


Brick adazuwo, ma nkume awara awa ka ayi gēji wu: eb͕utuzuwo osisi sycomore, ma osisi cedar ka ayi gētiye n'ọnọdu ha.


Ndi ahu gāma kwa, ha nile, bú Efraim na onye bi na Sameria, ndi nēkwu okwu nime npako na n'oké obi, si,


Ma ọ buru na unu egeghm nti ido ubọchi-izu-ike nsọ, na ighara ibū ibu bata n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem n'ubọchi-izu-ike; M'gēsuye kwa ọku n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, ọ gērichapu kwa ulo-elu nile nke Jerusalem, agaghi-emenyu kwa ya.


Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ọ̀ gēchezọ ihe-ichọ-nma-ya? nwayi aluru ọchu, ọ̀ gēchozọ ihe ike n'úkwù-ya? ma ndim echezọwom ubọchi nādighi ọnu-ọgugu.


Ndi nēchè èchìchè ime ka ndim chezọ aham site na nrọ nile ha nke ha nēzeritara ibe-ha n'otù n'otù, dika ndi bu nna-ha chezọrọ aham site na Beal.


Olu ka anuru n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, bú ikwa-ákwá na aririọ-amara nile nke umu Israel; n'ihi na ha emewo ka uzọ-ha gbagọ, ha echezọwo Jehova, bú Chineke-ha.


Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i chezọwom, tufuem n'azu-gi, n'ihi nka gi onwe-gi būru kwa ajọ ihe-nzube-gi na ikwa-iko-gi nile.


Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom.


M'gēji kwa ubọchi nile nke Bealim leta ya, bú ndi ọ nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, chiri nb͕a-aka-imi-ya na ihe-ichọ-nma-ya ke onwe-ya, jeso ndi nāhu ya n'anya, ma Mu ka o chezọrọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.


ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Taia, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.


ma M'gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra.


ma M'gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n'iti-nkpu agha n'ubọchi agha, n'oké ifufe n'ubọchi oké ikuku:


ma M'gēzite ọku n'ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad.


ma M'gēzite ọku na Juda, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Jerusalem.


N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.


Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu, I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan