Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 8:10 - Bible Nso

10 E, mb͕e ha gēgo ha n'etiti mba nile, ub͕u a ka M'gāchikọta ha; ọ gēwuta kwa ha nwa mb͕e ntà site n'ibu eze ndi-isi gēbo ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche, aga m achịkọta ha. Ha ga-atakwa ahụ nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 8:10
21 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Jehova huru nweda-n'ala nke Israel, na ọ di ilu nke-uku: ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọdu onye arapuru fọduru, ọ dighi kwa onye-iye-aka ọ bula Israel nwere.


Ya ka Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide; Hoshea we ghọ orù-ya, butere ya onyinye-inata-iruọma.


Eze Asiria we hu nkekọta-madu imegide ya n'aru Hoshea; n'ihi na o zigara So, bú eze Ijipt, ndi-ozi, ma o bugoghi onyinye-inata-iru-ọma inye eze Asiria, dika ọ nēme kwa-arọ: eze Asiria we mechibido ya, ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ.


Chineke Israel we kpọte mọ Pul, bú eze Asiria, na mọ Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, o we me ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, o we me ka ha biarue Hala, na Haboa, na Hara, na osimiri Gozan, rue ta.


N'ihi na ọ nāsi, Ndi-isim, hà nile abughi ndi-eze?


ndi nēje irida n'Ijipt, ma ha ajughi ase n'ọnum; ib͕alaga ọsọsọ n'ebe siri ike nke Fero, na ib͕abà na ǹdò Ijipt!


Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n'asusu ndi-Ju, si, Nurunu okwu nile nke eze uku ahu, bú eze Asiria.


si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n'iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n'ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n'ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi:


Ndinyom nile nke nākwa iko ka ha nēnye onyinye: ma gi onwe-gi enyewo ndikom nile nāhu gi n'anya onyinye-gi nile, i we go ha ngo, ka ha si n'ebe nile di buruburu biakute gi n'ihi ikwa-iko-gi nile.


n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta ndi nile nāhu gi n'anya, ndi ihe-gi nātọ ha utọ, na ndi nile i huworo n'anya, ha na ndi nile i kpọworo asì; ọ bu na M'gāchikọta ha imegide gi buruburu, M'gēkpughe-kwa-ra ha ọtọ-gi, ka ha we hu ọtọ-gi nile.


Dika esi achikọta ọla-ọcha na ọla na ígwè na opù na b͕amb͕am n'etiti oké ọku, ifunwu ya ọku, ib͕aze ya; otú a ka M'gāchikọta unu n'iwem na n'ọnumam, tọb͕ọ unu n'ebe ahu, b͕aze unu.


Ohola we kwa iko mb͕e ọ nọ n'okpurum; agu ndi nāhu ya n'anya we gua ya, bú ndi Asiria ndi bu ab͕ata-obi-ya,


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka Nebukadreza, bú eze Babilon, si n'Ugwu biarue Taia, ọ bu eze nke ndi-eze, ọ gāchiri inyinya, chiri kwa ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya na nkpọkọta madu na ndi bara uba, bia.


Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a;


Mb͕e M'chọrọ, M'gādọ ha aka na nti; agāchikọta kwa ndi nile di iche iche imegide ha, mb͕e agēke ha ab͕u n'ajọ omume-ha abua.


Jehova nwe-kwa-ra ikpe Ya na Juda gēkpe, Ọ gēji kwa nmehie Jekob leta ya dika uzọ-ya nile si di; dika omume-ya nile si di ka Ọ gēnyeghachi ya.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ fọduru otù ub͕ò, nwa mb͕e ntà ka ọ bu, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa na oké osimiri na ala kpọrọ nku me nkpatu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan