Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 7:15 - Bible Nso

15 Ọ bu ezie na Mu onwem adọwo ha aka na nti, me ka ogwe-aka-ha di ike, ma Mu ka ha nēchè ihe ọjọ megide.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike, ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 7:15
18 Iomraidhean Croise  

Jehova we mere ha amara, nwe obi-ebere n'aru ha, che ha iru, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob mere, O kweghi kwa ibibi ha, O sighi kwa n'iru Ya chupu ha rue ub͕u a.


(Jehova we nye Israel onye-nzọputa, ha we pua n'okpuru aka Siria: umu Israel we biri n'ulo-ikwū-ha, dika na mb͕e gara aga.


Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba: Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.


Ndi chèworo ihe ọjọ di iche iche n'obi-ha; Ubọchi nile ọ bula ka ha nēzukọ ibu agha di iche iche.


N'ìhi gini ka mba nile meworo oké nkpọtu? N'ìhi gini ka ndi nile di n'uwa nātughari ihe-efu n'uche?


Rùe ole mb͕e ka unu ganāwagide madu? Unu nētipia ya, unu nile, Dika mb͕idi ruru eruru, dika ogige nke anēnuda enuda.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja, Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;


Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova: Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:


Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?


Ọ bu nbibi-gi, Israel, na i nēmegidem, nēmegide iye-aka-gi.


Gini ka unu nēchè megide Jehova? Ya onwe-ya nēme ka ọ gwusia: nkpab͕u agaghi-ebili nke ub͕ò abua.


Onye sitere n'aka Mọ Nsọ, site n'ọnu nna-ayi Devid onye nējere Gi ozi, si, N'ìhi gini ka mba nile mere oké nkpọtu, Ndi nile di n'uwa nātughari kwa ihe-efu uche?


n'ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n'ihe nile ha nātule n'obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri.


ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist;


unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya;


Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan