Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 7:11 - Bible Nso

11 Efraim we di ka nduru nēnweghi uche, ọ dighi obi amam-ihe o nwere: Ijipt ka ha kpọkuworo, Asiria ka ha jekuworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 7:11
25 Iomraidhean Croise  

Pul, bú eze Asiria, we bia imegide ala ahu; Menahem we nye Pul nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri, ka aka-ya we diyere ya ime ka ala-eze di ike n'aka-ya.


Ehaz we zigara Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, ndi-ozi, si, Orù-gi na nwa-gi ka m'bu: rigota, zọputam n'aka eze Siria na n'aka eze Israel, ndi nēbili imegidem.


Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya: Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe.


N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe, Mb͕e obi amam-ihe nādighi?


Onye nākwa nwayi iko, obi amam-ihe kọrọ ya: Onye nēmebi nkpuru-obi nke aka ya ka onye nēme ya bu.


Ma ub͕u a gini ka i nwere n'uzọ Ijipt, n'iṅu miri Shaihoa? ma-ọbu gini ka i nwere n'uzọ Asiria, n'iṅu miri nke Osimiri ahu?


Gini mere i ji kpaghari nke-uku ib͕anwe uzọ-gi? ihere Ijipt gēme kwa gi, dika ihere Asiria mere gi.


Ha gēsi n'Ijipt bia nāma jijiji dika nnunu, si kwa n'ala Asiria dika nduru: M'gēme kwa ka ha biri n'ulo nile ha: ọ bu ihe si n'ọnu Jehovaa puta.


Efraim ji ifufe azù onwe-ya, ọ nāb͕aso kwa ifufe Iru-anyanwu: ogologo ubọchi nile ọ nēme ka okwu-ugha na nbibi ba uba; ha na Asiria nāb͕a kwa ndu, anēbuga kwa manu n'Ijipt.


Jehova nwe-kwa-ra ikpe Ya na Juda gēkpe, Ọ gēji kwa nmehie Jekob leta ya dika uzọ-ya nile si di; dika omume-ya nile si di ka Ọ gēnyeghachi ya.


Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere.


Ikwa-iko na manya-vine na manya-vine ọhu nēwepu obi amam-ihe.


Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.


Efraim we hu ọria-ya, Juda hu-kwa-ra ọnyá-ya, Efraim we je Asiria, zigara eze, bú Jereb: ma onye ahu apughi igwọ unu, ọ gaghi-eme kwa ka ọnyá si n'aru-unu la.


Omume nile ha agaghi-ekwe ha ichighakute Chineke-ha: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile di nime ha, ọ bu kwa Jehova ka ha nāmaghi.


Àjà nile nke onyinyem nile, ha nāchu anu nàjà, we rie ya; ihe-ha adighi-atọ Jehova utọ: ub͕u a ka Ọ gēcheta ajọ omume-ha, leta nmehie nile ha; ha onwe-ha gālaghachi n'Ijipt.


Ha agaghi-ebi n'ala Jehova; ma Efraim gālaghachi n'Ijipt, ọ bu kwa n'Asiria ka ha gēri ihe ruru árú.


N'ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n'ulo-ikwū nile ha.


Rue ókè-ala ka ndi nile gi na ha nọ n'ọb͕ub͕a-ndu zipuworo gi: ndi gi na ha nọ n'udo arafuwo gi, nwe ike imegide gi; nri-gi ka ha nēme ka ọ buru ọnyà n'okpuru gi: ọ dighi nghọta di nime ya.


Le, Mu onwem nēzipu unu dika aturu n'etiti agu: ya mere, burunu ndi nwere uche dika agwọ, ndi nādighi kwa aghughọ dika nduru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan