Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n'ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n'ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi?
Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n'ihi na iwu agaghi-esi n'ebe onye-nchu-àjà nọ la n'iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n'ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n'ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n'okwu-ya nile.
Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.
Ihe ọjọ nile ha di nime Gilgal: n'ihi na n'ebe ahu ka M'kpọrọ ha asì: n'ihi ihe ọjọ nke omume nile ha ka M'gāchupu ha n'ulom: M'gaghi-ahu kwa ha n'anya ọzọ; ndi-isi-ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha.