Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 5:14 - Bible Nso

14 N'ihi na Mu onwem gādiri Efraim ka ọdum, di-kwa-ra ulo Juda ka nwa-ọdum: Mu onwem, ọbuná Mu Onwem gādọka, la; M'gēbupu, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Nʼihi na-aga m adị ka ọdụm nye Ifrem dịkwa ka nwa ọdụm nye Juda. Aga m adọkasị anụ ahụ ha ma hapụ ha pụọ. Aga m ebupụ ha pụọ, na-enweghị onye ga-abịa ịzọpụta ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 5:14
16 Iomraidhean Croise  

Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n'elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám: I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem.


Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu; Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.


Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke, Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:


Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum, Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.


uja ha nāb͕ọ di ka nke nne-ọdum, ha nāb͕ọ uja dika umu-ọdum; e, ha nēbib͕ọ, jide anu-ndọb͕u, buru ya la, ma onye-nnaputa adighi.


Ọ rapuwo okwu-ọhia-Ya, dika ọdum: n'ihi na ala-ha aghọwo ihe-iju-anya site n'idi-ọku nke mma-agha nēme ihe-ike, na site n'iwe-Ya di ọku.


Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche.


Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom.


M'gēme kwa ka osisi vine ya na osisi fig ya tọb͕ọrọ n'efu, nke ọ siworo, Onyinye ka ndia burum, nke ndi nāhum n'anya nyeworom: M'gēme kwa ha ka ha ghọ oké ọhia, anu ọhia ewe rie ha.


Bianu, ka ayi laghachikute Jehova: n'ihi na Ya onwe-ya adọkawo, Ọ gāgwọ kwa ayi; O tib͕uwo, Ọ gēkechi kwa ayi.


Ebe-nb͕alaga gālanari kwa onye ukwu ọsọ n'iyì, onye di ike agaghi-ab͕a kwa ike-ya ume, dike agaghi-ewepuga onwe-ya:


Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti mba nile, n'etiti ọtutu ndi di iche iche, dika ọdum n'etiti anumanu nke oké ọhia, dika nwa-ọdum n'etiti ìgwè ewu na aturu nile: nke gābu, mb͕e ọ gāgabiga, ọ gāzọda, dọkasia, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.


Agēb͕u ehi-gi n'anya-gi, ma i gaghi-eri nime anu-ya: agānapu gi inyinya-ibu-gi n'iru gi, ma agaghi-eweghachiri gi ya: agēnye ndi-iro-gi ìgwè ewu na aturu-gi, ma i gaghi-enwe onye-nzọputa.


Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya, Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ: Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu; M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike: Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan