Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 4:7 - Bible Nso

7 Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M'gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ka ha na-abawanye nʼọnụọgụgụ, otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 4:7
15 Iomraidhean Croise  

Site n'ubọchi nna-ayi-hà ayi onwe-ayi anọwo n'ikpe-ọmuma uku rue ta; ma n'ihi ajọ omume nile ayi ka enyere ayi onwe-ayi, na ndi-eze-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, n'aka ndi-eze ala ọzọ, na mma-agha, na na ndọta-n'agha, na nime nluta-n'agha, na n'ihere iru, dika o si di ta.


Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.


Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n'Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel.


N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.


Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom.


Ha eriwo kwa ihe, ma afọ agaghi-eju ha; ha akwawo iko, ma ha agaghi-aba uba kari: n'ihi na ha arapuwo inu olu Jehova.


Nurunu nka, unu ndi-nchu-àjà, ṅa-kwa-nu nti, unu ulo Israel, unu ulo eze, ge-kwa-nu nti, n'ihi na unu ka ikpé a diri; n'ihi na ib͕udu ka unu buworo na Mizpa, unu abuwo kwa ub͕u ab͕asara n'elu Teboa.


Ọzọ, dika usu ndi nāpunara madu ihe nēche anwu onye ọ bula, otú a ka òtù ndi-nchu-àjà nēb͕u madu n'uzọ Shekem: e, ajọ ihe-nzube ka ha meworo.


Efraim, dika anu-ufe ka nsọpuru-ha gēfepu: ọmumu-nwa na idi-ime na itu-ime ewe ghara idi.


Afọ ihere ejuwo i kari nsọpuru: ṅua, ọbuná gi onwe-gi, ghọ onye anēbìghi úgwù: iko aka-nri Jehova gēchighari rue gi aru, ihere nke jọb͕uru onwe-ya gādi kwa n'elu ebube-gi.


Ma Mu onwem emewo kwa ka unu buru ndi anēlelì na ndi di ala n'iru ndim nile, dika unu nādighi-esi edebe uzọm nile, kama unu nāhu madu iru-ọma n'iwu.


Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.


ndi ọgwugwu-ha bu ila-n'iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n'ihere-ha, ndi nātukwasi uche n'ihe uwa.


N'ihi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M'siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n'irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n'ihi na ndi nāsọpurum ka M'gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan