Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 4:6 - Bible Nso

6 Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 4:6
54 Iomraidhean Croise  

Ma ọtutu ubọchi ka Israel nọ nēnweghi Chineke nke ezi-okwu, nēnweghi kwa onye-nchu-àjà nēzí ihe, nēnweghi kwa iwu:


Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha, Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.


Ekworom ekpochapuwom, N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.


Hu nweda-n'alam, dọputam; N'ihi na echezọghm iwu-Gi.


Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu; Ma echezọghm iwu-Gi.


N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala; Ma anya npako, I gēme ka ha di ala.


Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu: Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha.


Ọzọ, mb͕e nkpuru-obi nēnweghi ihe-ọmuma ọ dighi nma; Onye ukwu-ya nēme ngwa nēhie uzọ.


Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzùzù-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amaghi, ndim atukwasighi uche.


N'ihi na i chezọwo Chineke nke nzọputa-gi, na n'ihi na i chetaghi oké nkume ahu, bú ebe-gi siri ike; n'ihi nka ka i nāku ihe-ọkuku di iche iche nke di utọ, ọ bu kwa alaka osisi vine nke ala ọzọ ka i nāma nime ya:


Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n'ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n'ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n'aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara.


Ma ọbuná ndia adaghariwo site na manya-vine, ọ bu kwa site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ha ṅaghariworo; onye-nchu-àjà na onye-amuma adaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, manya-vine elodawo ha, ha aṅaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ha adaghariwo n'ọhuhu, ha asuwo ngọngọ n'ihe nile ekpere n'ikpe.


ewe were akwukwọ ahu nye onye nāmaghi akwukwọ, si, Biko, gua nka: o we si, Amaghm akwukwọ.


Ndim, ndi nāchi ha n'ihe-ike bu nwatakiri, ndinyom achiwo kwa ha. Gi ndim, ndi-nduzi-gi nēme ka i wagharia, ha elodawo kwa uzọ nke okporo-uzọ-gi nile.


Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.


N'ihi nka ndim ejewo biri n'ala ọzọ, site n'amaghi-ama: ndi-nsọpuru-ha bu kwa ndi agu nāgub͕u, ìgwè-ha bu kwa ndi akpiri miri nākpọsi nku ike.


Ndi-nchu-àjà asighi, Òle ebe Jehova nọ? ọzọ, ndi ji iwum eme ihe amaghm: ndi-ọzùzù-aturu jehie-kwa-ra megidem, ndi-amuma ji-kwa-ra Beal bu amuma, ọ bu kwa ihe nādighi-abà urù ka ha jesoro.


N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.


Biko, nurunu nka, unu ndi di nzuzu, nke obi amam-ihe nādighi; anya abua ka ha nwere, ma ha adighi-ahu uzọ; nti abua ka ha nwere, ma ha adighi-anu ihe:


Ọ bu kwa ndim ka ha gēzí ihe di iche n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ọ bu kwa ihe di iche n'etiti ihe di ọcha na ihe ruru árú ka ha gēme ka ha mara.


Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom.


M'gēji kwa ubọchi nile nke Bealim leta ya, bú ndi ọ nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, chiri nb͕a-aka-imi-ya na ihe-ichọ-nma-ya ke onwe-ya, jeso ndi nāhu ya n'anya, ma Mu ka o chezọrọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Nurunu okwu Jehova, umu Israel: n'ihi na ikpé ka Jehova na ndi bi n'ala nka gēkpe, n'ihi na ọ dighi ezi-okwu, ọ dighi kwa ebere, ọ dighi kwa ọmuma Chineke, di n'ala nka.


Ndim nāju ase n'aka osisi-ha, nkpa-n'aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n'okpuru Chineke-ha kwa iko.


M'gaghi-eji nmehie-ha leta umu-unu ndinyom mb͕e ha nākwa iko, M'gāghi-eji kwa nmehie-ha leta ndinyom unu luworo ọhu mb͕e ha nākwa iko; n'ihi na ha onwe-ha nēwezuga onwe-ha so ndinyom nākwa iko, ha nēso kwa ndinyom edoro nsọ ikwa iko chua àjà: ma ndi ọ bula nke nādighi-aghọta ka agākwatu n'ala.


Omume nile ha agaghi-ekwe ha ichighakute Chineke-ha: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile di nime ha, ọ bu kwa Jehova ka ha nāmaghi.


N'ihi na ebere atọwom utọ, ọ bughi àjà; ọmuma Chineke atọwokwam utọ kari àjà-nsure-ọku nile.


Efraim we di ka nduru nēnweghi uche, ọ dighi obi amam-ihe o nwere: Ijipt ka ha kpọkuworo, Asiria ka ha jekuworo.


Ndi ala ọzọ eripiawo ike-ya, ma ya onwe-ya amagh: e, efesawo ya isi-awọ, ma ya onwe-ya amaghi.


Tiye opì-ike n'okpo-ọnu-gi. Dika ugo ka ọ nābia megide ulo Jehova; n'ihi na ha agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, ọ bu kwa iwum ka ha jehieworo megide.


Anamedere ya orú nnù ihe na nnù ise nke iwum, ma dika ihe ala ọzọ ka aguworo ha.


Israel echezọwo kwa Onye ahu Nke meworo ya, o we wue ulo uku di iche iche; Juda emewo kwa ka obodo ewusiri ike ba uba: ma M'gēzite ọku n'obodo-ya nile, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.


Chinekem gāju ha, n'ihi na ha egeghi Ya nti: ha gābu kwa ndi nāwaghari n'etiti mba nile.


Jesi we mua Devid, bú eze. Devid we mua Solomon site na nwunye nke Uraia;


Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù.


Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha; Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.


Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan