Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 4:4 - Bible Nso

4 Ma otú ọ di, ka onye ọ bula ghara ise okwu, ka onye ọ bula ghara kwa iba nba; n'ihi na ndi-gi di ka ndi nēseso onye-nchu-àjà okwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 4:4
8 Iomraidhean Croise  

Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n'ihi na iwu agaghi-esi n'ebe onye-nchu-àjà nọ la n'iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n'ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n'ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n'okwu-ya nile.


M'gēme kwa ka ire-gi rapara n'okpo-ọnu-gi, i we ghọ ob͕i, ghara iburu ha onye nādọ aka na nti: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


Onye ekekọtaworo n'arusi di iche iche ka Efraim bu; kwe ka ọ nọduru onwe-ya.


Ha nākpọ onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama asì, ọ bu kwa onye nēkwu okwu n'izu-okè ka ha nākpọ onye-árú.


N'ihi nka onye nwere uche gēdere du n'oge ahu; n'ihi na oge ọjọ ka ọ bu.


Ma mb͕e nwa-nne nna madu, bú onye-nsure-ọku-ya, gēburu ya ichipu ọkpukpu n'ulo, si onye nke nọ n'ime-ime-ulo nke ulo ahu, Ọ̀ di onye ọzọ gi na ya nọ? ọ gāsi, É-è; si kwa, Nọdu du; n'ihi na ayi agaghi-ehota aha Jehova.


Ma nwoke ahu nke nēme nganga, n'egeghi nti onye-nchu-àjà ahu nke nēguzo ije ozi n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ma-ọbu n'egeghi nti onye-ikpe ahu, nwoke ahu gānwu kwa: i gēkpochapu kwa ihe ọjọ ahu n'Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan