olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha, n'ala ka agēde ha, n'ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.
Efraim ji ifufe azù onwe-ya, ọ nāb͕aso kwa ifufe Iru-anyanwu: ogologo ubọchi nile ọ nēme ka okwu-ugha na nbibi ba uba; ha na Asiria nāb͕a kwa ndu, anēbuga kwa manu n'Ijipt.
Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n'etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n'ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike.