Efraim ji ifufe azù onwe-ya, ọ nāb͕aso kwa ifufe Iru-anyanwu: ogologo ubọchi nile ọ nēme ka okwu-ugha na nbibi ba uba; ha na Asiria nāb͕a kwa ndu, anēbuga kwa manu n'Ijipt.
Ma ub͕u a ha nēmehie kari, we mere onwe-ha arusi apiri api site n'ọla-ọcha-ha, bú arusi di iche iche dika nghọta-ha si di, ọlu nke ndi-ọ̀kà ka ha nile bu: ọ bu bayere ihe ndia ka ha onwe-ha nēkwu okwu, si, Ka ndi nāchu àjà madu sutue umu-ehi ọnu.
Onye nēme ajọ omume, ya me ajọ omume ga n'iru: onye ru-kwa-ra inyi, ka eme ka o ru inyi ga n'iru: onye ezi omume, ya me ezi omume ga n'iru: onye di kwa nsọ, ka edo ya nsọ ga n'iru.