Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 4:16 - Bible Nso

16 N'ihi na Israel ewezugawo onwe-ya, dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nēwezuga onwe-ya: ub͕u a ka Jehova gāzù ha dika nwa-aturu n'ebe sara mbara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ndị Izrel dị isiike dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 4:16
19 Iomraidhean Croise  

Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha, Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi; Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha, Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.


Ọ gāfukọtasi gi ike dika ihe-ọtutú tua gi n'ala sara mbara n'aka abua; n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ub͕ọ-ala nile nke nsọpuru-gi gādi, gi ihe-nlelì nke ulo onye-nwe-gi!


Ọ gēnye kwa míri-ozuzo nke nkpuru-ọghigha-gi, nke i gāgha n'ala-ubi-gi; na achicha nke ihe-omume nke ala-ubi, ọ gāma kwa abuba, ba uba: n'ubọchi ahu anu-ulo-gi nile gāta nri n'ebe-íta-nri sara mbara.


Umu-aturu gāta kwa nri dika ọ bu n'ọzara-ha, ndi-ọbìa gērichapu kwa nkpọnkpọ-ebe nile nke ndi ahu mara abuba.


Ọ bu ezie na ajọ omume-ayi azawo megide ayi, ma Gi lua olu n'ihi aha-Gi, Jehova: n'ihi na ndaghachi-azu-ayi di ọtutu; Gi ka ayi mehieworo megide.


Jehova we sim, Israel nke nādaghachi azu egosiwo onwe-ya onye ezi omume kari Juda nke nāghọb͕u aghọb͕u.


Jehova we sim n'ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n'ebe ahu.


M'we hu na, mb͕e M'chupusiri Israel, nye ya akwukwọ nkewa-ya n'ihi ihe ndia nile, bú na Israel nke nādaghachi azu kwarari iko, na nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u aghọb͕u, Juda atughi egwu; ọ we je kwa iko, ọbuná ya onwe-ya.


Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n'aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m'we chigharia onwem; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.


N'ihi ya ọdum nke sitere n'oké ọhia gētib͕u ha, anu-ọhia wolf nke ala ihe nādighi gēbibi ha, agu ganēche obodo nile ha anya, agādọb͕u onye ọ bula nke nāpu nime ha: n'ihi na njehie-ha di ọtutu, ndaghachi-azu nile nke ha di kwa ike.


Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha-n'ala, ha we jegharia na ndum-ọdu nile na n'isi-ike nke obi ọjọ ha, ha we daghachi azu, ghara iga n'iru.


Gini mere ndi nka nke Jerusalem ji adaghachi azu na ndaghachi-azu ebighi-ebi? ha ejidesiwo aghughọ ike, ha ajuwo ilọta.


Efraim bu kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke emeworo ka ọ muta ihe, nke nāhu izọcha ọka n'anya; ma Mu onwem agabigawo n'elu olu-ya di nma: M'gēme ka anọkwasi Efraim dika inyinya; Juda gādọ ihe eji gwu ala-ubi, Jekob gētipiara ya ájá.


Mma-agha gēfeghari kwa n'obodo-ya nile, me ka ihe-ntuchi-ya nile gwusia, ripia ha, site na ndum-ọdu nile ha.


N'ihi na ndim nākwughari efekefe n'obi idaghachi azu site n'ebe M'nọ: ọ bu ezie na Onye nke nọ n'elu ka ha nākpọ ha ibiakute, ma ọ dighi otù onye efu gēbuli onwe-ya elu.


Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.


Ha we ju iṅa nti, wezuga ubu-ha, me ka nti-ha di arọ́, ka ha we ghara inu ihe.


Echeghariwom na emewom Sọl eze: n'ihi na o siwo n'isom n'azu laghachi, ma o meghi ka okwum guzosie ike. Iwe Samuel we di ọku; o we tikue Jehova nkpu abali ahu nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan