Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 4:14 - Bible Nso

14 M'gaghi-eji nmehie-ha leta umu-unu ndinyom mb͕e ha nākwa iko, M'gāghi-eji kwa nmehie-ha leta ndinyom unu luworo ọhu mb͕e ha nākwa iko; n'ihi na ha onwe-ha nēwezuga onwe-ha so ndinyom nākwa iko, ha nēso kwa ndinyom edoro nsọ ikwa iko chua àjà: ma ndi ọ bula nke nādighi-aghọta ka agākwatu n'ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ, mgbe ha na-agba akwụna, maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ mgbe ha na-akwa iko, nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna, ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja, ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 4:14
23 Iomraidhean Croise  

O we me ka ndi edoro nsọ ikwa iko si n'ala-ya gabiga, o wezuga-kwa-ra arusi nile nke nna-ya-hà mere.


Ọ kwatu-kwa-ra ulo nile nke ndi edoro nsọ ikwa iko, nke di n'ulo Jehova, ebe ndinyom nākpara Ashera ulo-ikwū.


Ndi ọjọ adighi-aghọta ikpé: Ma ndi nāchọ Jehova nāghọta ihe nile.


N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike.


Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n'ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n'ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n'aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara.


Nkita-ya nile nēribiga ihe ókè, ha amaghi afọ-ojuju; ndi ahu bu kwa ndi-ọzùzù-aturu nāmaghi ighọta ihe: ha nile echewo uzọ nke aka ha iru, onye ọ bula ọ che urù-ya iru site n'akuku nile ọ bula.


Ọtutu madu gēme onwe-ha ka ha di ọcha, ha gēme onwe-ha ka ha nwue ọcha, agānucha kwa ha; ma ndi nēmebi iwu gēmebi iwu; ndi nile nke nēmebi iwu agaghi-aghọta kwa ihe: ma ndi ahu ndi nwere uche gāghọta.


Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāma kwa ha. N'ihi na uzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.


Nurunu okwu Jehova, umu Israel: n'ihi na ikpé ka Jehova na ndi bi n'ala nka gēkpe, n'ihi na ọ dighi ezi-okwu, ọ dighi kwa ebere, ọ dighi kwa ọmuma Chineke, di n'ala nka.


Onye ekekọtaworo n'arusi di iche iche ka Efraim bu; kwe ka ọ nọduru onwe-ya.


Omume nile ha agaghi-ekwe ha ichighakute Chineke-ha: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile di nime ha, ọ bu kwa Jehova ka ha nāmaghi.


ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:


n'ihi nka ka Jehova siri otú a: Nwunye-gi ganākwa iko n'obodo, umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom gāda kwa site na mma-agha, agēji kwa eriri kèsa ala-gi; gi onwe-gi gānwu kwa n'ala ruru árú, aghaghi ime kwa ka Israel si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.


Israel we kekọta onwe-ya n'aru Beal-peoa: iwe Jehova we di ọku megide Israel.


N'ìhi gini ka unu nāmaghi ihe M'nēkwu? Ọ bu n'ihi na unu apughi inu okwum.


Ọ dighi onye nāghọta, Ọ dighi onye nāchọ Chineke;


Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru.


n'ihi na emewo ka ha b͕a ọchichiri n'èchìchè-uche-ha, eme kwa ka ha buru ndi ala ọzọ n'ebe ndu nke Chineke di n'ihi amaghi-ihe di nime ha, n'ihi na anēme ka obi-ha me etili;


Nwayi edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi n'etiti umu-ndinyom Israel, nwoke edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi kwa n'etiti umu-ndikom Israel.


Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n'inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n'ezie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan