Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 4:12 - Bible Nso

12 Ndim nāju ase n'aka osisi-ha, nkpa-n'aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n'okpuru Chineke-ha kwa iko.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme, na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase. Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo; ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 4:12
25 Iomraidhean Croise  

O rue, n'ihi na umu Israel mehiere megide Jehova, bú Chineke-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt, si n'okpuru aka Fero, bú eze Ijipt, rigoputa, n'ihi na ha tu-kwa-ra egwu chi di iche iche ọzọ,


kama i jewo ije n'uzọ ndi-eze Israel, me Juda na ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, dika ulo Ehab mere ka akwa iko; ọzọ kwa, umu-nne-gi ndikom, bú ulo nna-gi, ndi di nma kari gi onwe-gi, ka i b͕uworo:


Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú, Ha we nākwa iko n'omume nile ha.


N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì: I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko.


Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.


ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n'ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi.


Ọ bu kwa n'aru ndi-amuma Sameria ka M'huworo ihe-nzuzu; ha jiri Beal bu amuma, we me ka ndim, bú Israel, kpafue.


ma ihe ahu nke nābà nime mọ-unu, ọ gaghi-adi ma-ọli; ọ bu na unu onwe-unu nāsi, Ayi gādi ka mba nile, dika ab͕uru nile nke ala nile, ijere osisi na nkume ozi.


N'ihi na eze Babilon guzoro n'ab͕ata uzọ, n'isi uzọ abua ahu, iju ase: o feghariri àkú-ya nile, jua ase n'aka terafim-ya, lekwasi imeju anya.


Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere.


Omume nile ha agaghi-ekwe ha ichighakute Chineke-ha: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile di nime ha, ọ bu kwa Jehova ka ha nāmaghi.


N'ulo Israel ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya: n'ebe ahu ka ikwa-iko nke Efraim nākwa di, emeruwo Israel.


Aṅurila, Israel, rue otite-egwú-ọṅù, dika ndi nile di iche iche; n'ihi na i puwo n'aka Chineke-gi kwaba iko, i huwo onyinye n'anya n'ebe-nzọcha-ọka nile.


Ha agaghi-achu-kwa-ra nkpi àjà-ha ọzọ, nke ha onwe-ha so nākwa iko. Ukpuru ebighi-ebi ka nka gāburu ha rue ọb͕ọ-ha nile.


Mu onwem gēdo kwa irum megide nwoke ahu, megide kwa ab͕uru-ya, Mu onwem gēbipu kwa ya ndi-nile nēso ya kwa iko, bú iso Molek kwa iko, n'etiti ndi-ha.


Ọ buru na onye ọ bula nke nējeghari n'ifufe na okwu-ugha ekwu okwu-ugha, si, M'gābusara gi okwu dika miri bayere manya-vine, baye-kwa-ra ihe-ọṅuṅu nāba n'anya; ọ gābu kwa onye nābusara ndi nka okwu dika miri.


Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya.


ọ gābu-kwa-ra unu ọnu-ọnu usọ uwe, ka unu we hu ya anya, we cheta ihe nile Jehova nyere n'iwu, me kwa ha; ka unu we ghara kwa iledo otú unu gēso obi-unu, otú unu gēso kwa anya-unu, nke unu onwe-unu nēso ha ikwa iko:


Jehova we si Moses, Le, gi na nna-gi-hà ganēdina; ndi nka gēbili kwa, soro chi ala ọzọ nile nke ala ahu kwa iko, bú ebe ha onwe-ha nābà n'etiti ya, ha gārapukwam, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum nke Mu nà ha b͕ara.


Ha we si ya, Biko, jua Chineke ase, ka ayi we mara ma ije-ayi, bú nke ayi onwe-ayi nēje, gāga nke-ọma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan