Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 4:10 - Bible Nso

10 Ha eriwo kwa ihe, ma afọ agaghi-eju ha; ha akwawo iko, ma ha agaghi-aba uba kari: n'ihi na ha arapuwo inu olu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, were onwe ha nyefee

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 4:10
18 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e ọnwu Jehoiada gasiri, ndi-isi Juda biara, kpọ isi ala nye eze. Mb͕e ahu eze gere ha nti.


Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel.


Okwu nile nke ọnu-ya bu ajọ ihe na aghughọ: Ọ rapuwo inwe uche na ime nma.


Onye ezi omume nēri ihe rue mb͕e afọ juru nkpuru-obi-ya: Ma afọ ndi nēmebi iwu, ihe nākọ ya.


Unu onwe-unu we chigharia ta, we me ihe ziri ezi n'anyam abua, n'ikpọsa, onye ọ bula ọ gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya pua n'aka-gi; unu we b͕a ndu n'irum n'ulo nke akpọkwasiri aham:


Ònye bu onye mara ihe, ka o we ghọta nka ònye bu kwa onye ahu ọnu Jehova gwaworo okwu, ka o we gosi ya? n'ìhi gini ka ala nka laworo n'iyì, esure kwa ya ọku dika ọzara, onye-ngabiga we ghara idi?


ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.


Ndi nāb͕a àmà ọjọ anọwo nime gi iwusi ọbara: ọ bu kwa n'ugwu nile ka ha riworo ihe nime gi: ajọ ihe-nzube ka ha meworo n'etiti gi.


M'gaghi-eji nmehie-ha leta umu-unu ndinyom mb͕e ha nākwa iko, M'gāghi-eji kwa nmehie-ha leta ndinyom unu luworo ọhu mb͕e ha nākwa iko; n'ihi na ha onwe-ha nēwezuga onwe-ha so ndinyom nākwa iko, ha nēso kwa ndinyom edoro nsọ ikwa iko chua àjà: ma ndi ọ bula nke nādighi-aghọta ka agākwatu n'ala.


Ha nile bu ndi nākwa iko; ha di ka ite-ọku uku nke osi-ite meworo ka ọ di ọku; ọ kwusiri ikpọnwu site na mb͕e edoziri utu ọka flour agwọrọ agwọ rue mb͕e emere ka o ko eko.


Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.


Gi onwe-gi gēri ihe, ma afọ agaghi-eju gi; afọ-awọrọ-gi gādigide kwa nime gi: i gēwezuga kwa ndi-gi, ma i gaghi-eme ka ha b͕apu; ma ndi i nēme ka ha b͕apu, ọ bu mma-agha ka M'gēwere ha nye.


na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.


Unu aghawo ọtutu nkpuru, ma nke-ntà ka unu webatara; unu nēri ihe, ma ọ dighi afọ juworo unu; unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ma ọ dighi nṅuju-afọ unu ṅujuworo; unu yiri uwe, ma ọ dighi okpom-ọku nēkpo madu; ọzọ, onye nāluta ugwọ-ọlu nāluta ugwọ-ọlu itiye n'akpa puru epu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan