Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 2:9 - Bible Nso

9 N'ihi nka ka M'gānaghachi ọkam na mb͕e-ya, na manya-vine ọhum na mb͕e-ya akara àkà, M'gānaputa kwa aji-anum na flax nkem nke enyere ikpuchi ọtọ-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara, na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru. Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m, nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 2:9
15 Iomraidhean Croise  

Ma, le, esetiwom akam imegide gi, M'we bilata òkè nri-gi, rara gi nye n'aka ọchichọ nkpuru-obi ndi nākpọ gi asì, bú umu-ndinyom ndi Filistia, ndi ihere uzọ ajọ nzube gi mere.


M'gēnye kwa gi n'aka-ha, ha ewe kwatue ulo ikwa-iko gi, tikpọ ebe-gi nile di elu, yipu uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma: ha gārapu gi i b͕arasia ọtọ.


Ha gēyipu kwa uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma.


Ma eze Ugwu ahu gēguzobe kwa ìgwè madu ọzọ bara uba kari ìgwè mbu; ọ bu kwa n'ọgwugwu mb͕e ndia, bú nke arọ ndia, ka ọ gābia abia, chiri usu-ndi-agha di uku, chi kwa ọtutu àkù.


ka M'we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n'ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua;


N'ihi na ifufe ka ha nāgha dika nkpuru-ọghigha, ọ bu kwa oké ifufe ka ha gēwe dika ihe-ubi: ọ dighi ọka guzoro eguzo o nwere; ihe-opupú agaghi-eme utu ọka; ọ buru na o me ma eleghi anya, ndi ala ọzọ gēloda ya.


Ebe-nzọcha-ọka na ebe-nzọcha-nkpuru-vine agaghi-azù ha, manya-vine ọhu gēbilata-kwa-ra ya.


Ònye mara? eleghi anya O gēchighari, chègharia uche, me ka ngọzi fọdu n'azu Ya; bú onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu inye Jehova, bú Chineke-unu.


Àkù-ha gāghọ kwa ihe apunaraworo ha, ulo nile ha gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: e, ha gēwu ulo, ma ha agaghi-ebi nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ma ha agaghi-aṅu manya-vine-ha.


Ọ bu ezie na Edom nāsi, Etituwo ayi, ma ayi gēwughachi nkpọnkpọ ebe nile; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ndi ahu gēwu, ma Mu onwem gākwatu: agākpọ kwa ha Ókè-ala nmebi-iwu, na Ndi ahu nke Jehova wesaworo oké iwe rue mḅe ebighi-ebi.


Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n'etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan