Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 2:8 - Bible Nso

8 Ma ya onwe-ya amaghi na ọ bu Mu onwem nyere ya ọka-ya na manya-vine ọhu ya, na manu ọhu ya, me ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba, bú nke ha ji mere Beal ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m, na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv, na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile nke o ji na-efe Baal.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 2:8
27 Iomraidhean Croise  

Jehova, bú Chineke-ayi, ọtutu ihe nile a nke ayi doziworo iwuru Gi ulo n'ihi aha nsọ Gi, n'aka-Gi ka o siri bia, ọ bu kwa Gi nwe ya nile.


Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m'gaghi-agabiga kwa, N'uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.


Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzùzù-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amaghi, ndim atukwasighi uche.


Ndi ahu ndi nāwufu ọla-edo n'akpa, ndi nātù kwa ọla-ọcha n'ihe-ọtùtù, ha nēgota onye-nnucha-ọla, o we me ya ka ọ buru chi: ha nāda kpu iru n'ala, e, ha nākpọ isi ala.


Umu-ha nāchikọta nkú, ndi bu nna nāfunwu ọku, ndinyom-ha nāgwọ utu ọka flour koro eko, imere eze-nwanyi nke elu-igwe achicha, na iwusiri chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe.


nọkwasi n'ihe-ndina di nsọpuru, nke table edoro n'usoro di kwa n'iru ya, ọ bu kwa ihe-nsure-ọkum nke nēsì ísì utọ na manum ka i dọbara n'elu ya.


Nebukadneza, bú eze, mere onyinyo ọla-edo, idi-elu-ya bu ọgu cubit atọ, obosara-ya bu cubit isi: ọ guzobere ya ọtọ na ndagwurugwu Dura n'ala-ọchichi Babilon.


ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh:


Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.


Mb͕e Efraim jiri ima-jijiji kwu okwu, ya onwe-ya buliri onwe-ya elu n'Israel: ma ikpe mara ya nime Beal, o we nwua.


Ma ub͕u a ha nēmehie kari, we mere onwe-ha arusi apiri api site n'ọla-ọcha-ha, bú arusi di iche iche dika nghọta-ha si di, ọlu nke ndi-ọ̀kà ka ha nile bu: ọ bu bayere ihe ndia ka ha onwe-ha nēkwu okwu, si, Ka ndi nāchu àjà madu sutue umu-ehi ọnu.


N'ihi na nne-ha akwawo iko: nwanyi nke turu ime ha emewo ihe-ihere: n'ihi na ọ siri, Ka m'jeso ndi nāhum n'anya, ndi nēnyem nrim na mirim na aji-anum na flax nkem na manum na ihe-ọṅuṅum.


Ikwa-iko na manya-vine na manya-vine ọhu nēwepu obi amam-ihe.


Ha onwe-ha edowo ndi-eze, ma ọ bughi site n'akam; ha edowo ndi-isi, ma amaghm: ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha ka ha jiworo mere onwe-ha arusi di iche iche, ka ewe bipu ha.


N'ihi nka ka ọ nāchuru eriri-ya àjà, nēsurere ub͕u-ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; n'ihi na site na ha ka òkè-ya nwere urù, ihe-oriri-ya ma-kwa-ra abuba.


Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n'ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n'idi ndu nke ila-n'iyì.


Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi;


Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha, otú ọ di ta.


Ha we pua ba n'ubi, ghọ nkpuru ubi-vine nile ha, zọcha nkpuru-vine, me ememe otuto, ba n'ulo chi-ha, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, kọcha Abimelek.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan