Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 2:6 - Bible Nso

6 N'ihi nka, le, M'gaje iji ogwu b͕achi uzọ-gi, M'gāb͕achibido kwa ya ogige, o we ghara ichọputa okporo-uzọ-ya nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu; aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 2:6
10 Iomraidhean Croise  

Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m'gaghi-agabiga kwa, N'uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.


N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè, Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya?


Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko.


N'ihi na ndim echezọwom, ihe-efu ka ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye; ha we me ka ha su ngọngọ n'uzọ nile ha, bú uzọ-ije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, ije ije n'okporo-uzọ di iche iche, bú uzọ anātulighi atuli;


Agēkpochapu kwa ebe nile di elu nke Even, bú nmehie Israel: ogwu na uke gēpulite n'ebe-ichu-àjà nile ha; ha gāsi kwa ugwu nile, Kpuchienu ayi; ha gāsi kwa ugwu ntà nile, Dakwasinu ayi.


N'ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n'ulo-ikwū nile ha.


N'ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n'akuku nile,


N'ihi ọkika nke nkpughe ndia-n'ihi ya, ka ewe ghara iwelibigam ókè, enyerem ogwu n'anu-arum, bú mọ-ozi nke Setan, ka o we tiem aka, ka ewe ghara iwelibigam ókè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan