Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 2:4 - Bible Nso

4 ọ bu kwa n'aru umu-ya ndikom ka M'nāgaghi-enwe obi-ebere; n'ihi na umu-ndikom amuru n'ikwa-iko ka ha bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 2:4
17 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Jehoram huru Jihu, na ọ siri, Ùdo di kwa, Jihu? Ọ si, Gini bu udo ahu, na mb͕e ikwa-iko Jezebel, bú nne-gi, na mb͕asi-ya nādi ọtutu?


Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n'ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n'ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n'aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara.


Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.


Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko.


M'gātupia kwa ha, otù onye n'elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n'otù; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: M'gaghi-enwe ọmiko, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M'we ghara ibibi ha.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n'ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n'obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n'aru ha: n'ihi na ewepuwom udom n'ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile.


M'gēdo kwa ekworom imegide gi, ha gēmeso kwa gi n'ọnuma; imi-gi na nti-gi abua ka ha gēwezuga; ọzọ, ndi gēsota gi n'azu gāda site na mma-agha: umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom ka ha gāchiri; ọku gēripia kwa ndi gēsota gi n'azu.


Ma Mu onwem gēmeso kwa ha n'ọnuma: anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: ọ buru kwa na ha akpọ nkpu na ntim abua n'oké olu, ma M'gaghi-anu olu-ha.


Ma Mu onwem kwa, anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko, uzọ-ha ka M'gētiyekwasi n'isi-ha.


Isi-nmalite nke ikwu-okwu Jehova n'ọnu Hosea. Jehova we si Hosea, Je, luru n'onwe-gi nwunye nke nākwa iko na umu amuru n'ikwa-iko: n'ihi na ala nka nākwa iko nke-uku, ghara iso Jehova.


O we turu ime ọzọ, mua nwa-nwanyi. Jehova we si Hosea, Kpọ aha-ya Lo-ruhama: n'ihi na M'gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel ọzọ, ka M'we bupuru ha nmehie-ha ma-ọli.


Jehova ka ha ghọb͕uworo; n'ihi na umu nābughi nke Ya ka ha muworo: ub͕u a ka ọnwa ọhu gēripia ha, ha na òkè nile ha.


Mọ-ozi nke Jehova we za, si, Jehova nke usu nile ndi-agha, rùe ole mb͕e ka Gi onwe-gi nāgaghi-emere Jerusalem na obodo Juda nile ebere, bú nke I wesaworo oké iwe ọgu arọ atọ na iri ndia?


Unu onwe-unu nālu ọlu nna-unu. Ha siri Ya, Amughi ayi onwe-ayi site n'ikwa-iko otù Nna ka ayi nwere, bú Chineke.


Ya mere le obi-ọma na aka-ike nke Chineke: n'aru ndi ndi a ka aka-ike-Ya dakwasiri; ma n'aru gi ka obi-ọma Chineke nādikwasi, ma ọ buru na i gānọgide n'obi-ọma-Ya: ebe agēbipu kwa gi onwe-gi ma ọ buru na i nọgideghi otú a.


Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili.


N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan