Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 2:15 - Bible Nso

15 M'gēsi kwa n'ebe ahu nye ya ubi-vine-ya nile, na ndagwurugwu Ekoa ibu ọnu-uzọ olile-anya: ọ gāza kwa n'ebe ahu, dika n'ubọchi nile ọ di na nwata, na dika n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya, gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya. Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa, nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 2:15
33 Iomraidhean Croise  

O rue, dika agāsi na ọ bu ihe nfe na ọ nējeghari na nmehie nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na ọ luru Jezebel na nwunye, bú nwa-nwayi Etbeal eze ndi Zaidon, ọ we je fè Beal òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ya.


Ha we kwere okwu-Ya nile; Ha nābù abù otuto-Ya.


Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata, Biko, ka Israel kwue otú a, si,


Sheron gāghọ kwa ebe-ita-nri nke ìgwè ewu na aturu, ndagwurugwu Ekoa gāghọ kwa ebe ìgwè ehi nāmakpu amakpu. diri ndim chọworom.


Ha gēwu kwa ulo, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, rie nkpuru-ha.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n'ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n'anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n'ọzara, n'ala anāghaghi nkpuru.


N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.


Ì sighi na mb͕e a kpọkuem, si, Nnam, di m'nwere n'ab͕ọghọ ka I bu?


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n'ala nka.


Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere.


Ma n'ihe-árú-gi nile na ikwa-iko-gi nile i chetaghi ubọchi nile mb͕e i di na nwata, mb͕e i b͕asiri ọtọ, onye anāzọtọ n'ọbara-gi ka i bu kwa.


Ma Mu onwem gēcheta ọb͕ub͕a-ndu Mu na gi b͕ara n'ubọchi mb͕e i di na nwata, M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi guzosiere gi ike.


M'we gabiga n'akuku gi, hu gi, ma, le, mb͕e-gi bu mb͕e ihe-gi nātọ utọ; M'we b͕asa ọnu-ọnu-ala uwe-nwudam n'aru gi, kpuchie ọtọ-gi, ṅuara gi iyi, Mu na i we b͕a ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), i we ghọ onye nkem.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gāchikọputawori ulo Israel n'etiti ndi nile di iche iche, bú ndi ha b͕asaworo n'etiti ha, mb͕e agēdoworim nsọ nime ha n'anya mba nile, ha gēbi kwa n'elu ala-ha, nke M'nyere orùm, bú Jekob.


Ha gēbi n'elu ya na ntukwasi-obi; ha gēwu kwa ulo, kua ubi-vine, biri na ntukwasi-obi; mb͕e M'mesiri ihe nile ekpere n'ikpe n'aru ndi nile nēlelì ha n'ebe nile di ha buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.


Mb͕e Israel bu nwata, ahurum ya n'anya, ọ bu kwa site n'Ijipt ka M'kpọputara nwam.


Ọ bu kwa onye-amuma ka Jehova jiri me ka Israel si n'Ijipt rigoputa, ọ bu kwa onye-amuma ka ejiri debe ya.


Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; M'gēme kwa ka i biri n'ulo-ikwū ọzọ, dika n'ubọchi nile nke mb͕e akara àkà.


Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; ọ dighi kwa chi, ma-ọbughi náním, i gāmara, onye-nzọputa adighi kwa, ma-ọbughi náním.


M'gēme kwa ka osisi vine ya na osisi fig ya tọb͕ọrọ n'efu, nke ọ siworo, Onyinye ka ndia burum, nke ndi nāhum n'anya nyeworom: M'gēme kwa ha ka ha ghọ oké ọhia, anu ọhia ewe rie ha.


M'gēme kwa ka ndim adọtara n'agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọb͕ọrọ n'efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ṅua manya-ha; ha gēme kwa ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha.


Laghachinu n'ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M'nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M'gēnyeghachi gi.


Mb͕e ahu Israel nābù abù a, si: Rigo, gi olùlù-miri; zanu ya:


Mu onwem bu ọnu-uzọ ahu: ọ buru na onye ọ bula esi na Mu ba, agāzọputa ya, ọ ganābata kwa nāpu kwa, nāhu kwa nri ọ gāta.


Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ.


Ha we guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta; Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia. N'ihi ya akpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Ekoa, rue ta.


Ma umu Israel echetaghi Jehova, bú Chineke-ha, Onye nānaputa ha n'aka ndi-iro-ha nile buruburu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan