Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 2:14 - Bible Nso

14 N'ihi nka, le, Mu onwem gaje iràra ya, me ka ọ je n'ọzara, M'gāgwa kwa ya okwu nke gābà ya n'obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Nʼihi nke a, aga m arara ya, duba ya nʼime ọzara, jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 2:14
38 Iomraidhean Croise  

Nkpuru obi ya we rapara n'aru Daina nwa-nwayi Jekob, ọ hu nwa-ab͕oghọ ahu n'anya, gwa nwa-ab͕ọghb͕ọ ahu okwu nābà ya n'obi.


Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕u Ba n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya; Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba.


Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso: Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya: Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi, Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine: N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya.


Ọ bu kwa n'ihi nka ka Jehova gēchere, imere unu amara, ọ bu kwa n'ihi nka ka agēbuli Ya, inwe obi-ebere n'aru unu: n'ihi na Chineke nke ikpé ka Jehova bu; ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nile ndi nēchere Ya bu.


Ma ub͕u a, biko, ka m'me ka unu mara ihe mu onwem gaje ime ubi-vine nkem: m'gēwezuga ogige-ya, o we ghọ ebe anu-ulo nāta nri; m'gētipia mb͕idi-ya, o we ghọ ebe anāzọtọ:


N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na agaghi-asi kwa ọzọ, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n'ala Ijipt rigoputa;


Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n'ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n'anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n'ọzara, n'ala anāghaghi nkpuru.


Otú a ka i gāsi ya, Otú a ka Jehova siri: Le, ihe nke M'wuworo ka Mu onwem nākwada, ọzọ, ihe nke M'kuworo n'ubi ka Mu onwem nēropu; ọbuná ala nka nile, nkem ka ọ bu.


M'we me ka ha si n'ala Ijipt puta, M'we me ka ha ba n'ọzara.


Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie ọ bu aka di ike, ọ bu kwa ogwe-aka esetiri eseti, ọ bu kwa ọnuma awusiri awusi, ka M'gēji buru eze-unu:


ka M'we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n'ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua;


Ọ bu kwa arusi-ya nile apiri api ka agētipia, ọ bu kwa onyinye ikwa-iko ya nile ka agēsure n'ọku, ọ bu kwa arusi-ya nile ka M'gēme ebe tọb͕ọrọ n'efu: n'ihi na o siworo n'onyinye nwanyi nke nākwa iko chikọta ha, ọ bu kwa rue onyinye nwanyi nākwa iko ka ha gālaghachi.


Nāb͕ali, Jisie ike imuputa nwa, gi ada Zaion, dika nwanyi ime nēme: n'ihi na ub͕u a ka i gāpu n'obodo, biri n'ọhia, biarue Babilon; n'ebe ahu ka agānaputa gi; n'ebe ahu ka Jehova gāb͕aputa gi n'aka ndi-iro-gi.


Mu onwem, ọ buru na eweliem elu site n'ala, M'gādọrọ kwa madu nile nye onwem.


Ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na Nna Nke ziterem adọghi ya: Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.


Ewe nye nwanyi ahu nkù abua ahu nke oké ugo ahu, ka o we febà n'ọhia la n'ọnọdu-ya, ebe anāzù ya otù oge, na oge abua, na nkera otù oge, ka ọ pua n'iru agwọ ahu.


Nwanyi ahu we b͕alaga nime ọhia, ebe o nwere ọnọdu edoziworo site n'aka Chineke, ka ha we zùa ya n'ebe ahu nnù ubọchi atọ na ọgu atọ.


Nwoke-ya we bilie, jeso ya, igwa ya okwu gābà ya n'obi, ime ka ọ lata, nwa-okorọbia-ya na inyinya-ibu abua soro kwa ya je: nwayi ahu we me ka ọ ba n'ulo nna-ya: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, ṅuria izute ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan