O we chuara chi nile nke Damaskọs àjà, bú ndi tib͕uru ya: ọ si, N'ihi na chi nke ndi-eze Siria nēyere ha aka, ndi ahu ka m'gāchuru àjà, ka ha we yerem aka. Ma chi ahu buru ya, bu-kwa-ra Isarel nile, ihe mere ka ọ su ngọngọ.
Nmata ha nāmata iru madu n'ikpe azawo megide ha; nmehie-ha ka ha gosiwo-kwa-ra dika Sọdọm, ha ezobeghi ya. Ahuhu gādiri nkpuru-obi-ha! n'ihi na ha emesowo onwe-ha ihe ọjọ.
Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n'aru gi, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.
Unu asiwo kwa, Le, ka o si buru oké ike-ọgwugwu! unu afùwo kwa ya na nlelì, ka Jehova nke ndi-agha siri; unu ewebatawo kwa ihe anapuru n'ike, na ihe gwọrọ ngwuro, na nāria ọria; otú a ka unu webataworo onyinye-inata-iru-ọma: #M'gānara nka nke-ọma nāka-unu? ka Jehova siri.
Ma uḅu a, biko, menu ka iru Chineke dajua, ka O we mere ayi amara: ọ bu site n'aka-unu ka nka diworo: Ọ̀ gāhu onye ọ bula nime unu iru-ọma? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri:
Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel: Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo, Onye bu ọta nke iye-aka-gi, Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi! Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n'okpuru gi; Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.