Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 13:6 - Bible Nso

6 Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ. Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga, chefuo m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 13:6
23 Iomraidhean Croise  

Ha onwe-ha efèghi kwa Gi n'ala-eze-ha, na n'ezi ihe-Gi bara uba nke I nyere ha, na n'ala ahu sara mbara nke nwe-kwa-ra ume, nke I tiyere n'iru ha, ha esighi kwa n'omume ọjọ nile ha chigharia.


Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju. Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.


Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ.


N'ihi na i chezọwo Chineke nke nzọputa-gi, na n'ihi na i chetaghi oké nkume ahu, bú ebe-gi siri ike; n'ihi nka ka i nāku ihe-ọkuku di iche iche nke di utọ, ọ bu kwa alaka osisi vine nke ala ọzọ ka i nāma nime ya:


M'gēsi kwa aṅa b͕aghara gi? umu-gi arapuwom, we were ihe nābughi chi ṅu iyi: mb͕e M'mere ka ha rijue afọ, ha we kwa iko, ọ kwa n'ulo nwanyi nākwa iko ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i chezọwom, tufuem n'azu-gi, n'ihi nka gi onwe-gi būru kwa ajọ ihe-nzube-gi na ikwa-iko-gi nile.


i jiwo iba-uba nke amam-ihe-gi, ji kwa ọzuzu-ahia-gi, me ka àkù-gi ba uba, obi-gi we di elu n'ihi àkù-gi:


Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.


Efraim we si, N'ezie aghọwom ọgaranya, achọtaworom onwem àkù: ihe nile m'nādọb͕u onwem n'ọlu inweta agaghi-achọtaram ajọ omume nke bu nmehie.


M'gēji kwa ubọchi nile nke Bealim leta ya, bú ndi ọ nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, chiri nb͕a-aka-imi-ya na ihe-ichọ-nma-ya ke onwe-ya, jeso ndi nāhu ya n'anya, ma Mu ka o chezọrọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọ gāb͕aso kwa ndi nāhu ya n'anya, ma ọ gaghi-eru ha aru; ọ gāchọ kwa ha, ma ọ gaghi-achọta ha: o we si, Ka m'je laghachikuru dim mbu; n'ihi na ọ dim nma mb͕e ahu kari ub͕u a.


Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.


Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M'gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere.


N'ihi na Mu onwem gādiri Efraim ka ọdum, di-kwa-ra ulo Juda ka nwa-ọdum: Mu onwem, ọbuná Mu Onwem gādọka, la; M'gēbupu, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.


Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.


Israel echezọwo kwa Onye ahu Nke meworo ya, o we wue ulo uku di iche iche; Juda emewo kwa ka obodo ewusiri ike ba uba: ma M'gēzite ọku n'obodo-ya nile, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.


Ha onwe-ha edowo ndi-eze, ma ọ bughi site n'akam; ha edowo ndi-isi, ma amaghm: ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha ka ha jiworo mere onwe-ha arusi di iche iche, ka ewe bipu ha.


Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu, I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan