Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 13:2 - Bible Nso

2 Ma ub͕u a ha nēmehie kari, we mere onwe-ha arusi apiri api site n'ọla-ọcha-ha, bú arusi di iche iche dika nghọta-ha si di, ọlu nke ndi-ọ̀kà ka ha nile bu: ọ bu bayere ihe ndia ka ha onwe-ha nēkwu okwu, si, Ka ndi nāchu àjà madu sutue umu-ehi ọnu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie, ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche, nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma, ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka. Ha onwe ha na-ekwu, “Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ. Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 13:2
33 Iomraidhean Croise  

Ma M'gēme ka nnù madu iri-na-asa na ọgu iri fọdu n'Israel, bú ikperè nile nke anēb͕ughi nye Beal, na ọnu ọ bula nke nēsutughi ya.


ha we si ha, Unu agaghi-ewebata ndọta-n'agha ahu n'ebe a: n'ihi na tukwasi ikpe-ọmuma Jehova nke mara ayi, unu onwe-unu nāsi na unu gātukwasi ihe na nmehie nile ayi na n'ikpe-ọmuma-ayi: n'ihi na o riri nne, bú ikpe-ọmuma mara ayi, iwe di ọku di kwa n'aru Israel.


Ma o rurughi ala n'iru Jehova, dika Manase, bú nna-ya, ruru ala; kama Emon nka mere ka ikpe ma ya ri nne.


Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n'iyì n'uzo, N'ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.


N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike.


Ahuhu gādiri umu nēwezuga onwe-ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ndi nēme ihe ezubeworo, ma o siteghi n'akam; ndi ji ihe-nkpuchi ekpuchi ihe, ma ọ bughi nke Mọm, ka ha we were nmehie tukwasi na nmehie:


Le, ihere gēme ndi ejikọtara ya na ha; ndi-ọ̀kà kwa, ha onwe-ha bu ihe zara madu: ka ha chikọta onwe-ha, ha nile, ka ha ọtọ; ha gātu oké egwu, ihere gēme ha n'otù.


Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.


Ndi ahu ndi nāwufu ọla-edo n'akpa, ndi nātù kwa ọla-ọcha n'ihe-ọtùtù, ha nēgota onye-nnucha-ọla, o we me ya ka ọ buru chi: ha nāda kpu iru n'ala, e, ha nākpọ isi ala.


Chetanu nka, jisi-kwa-nu ike: menu ka ọ biaghachi n'obi, unu ndi-njehie.


Ha ji ọla-ọcha, ji kwa ọla-edo, eme ya ka ọ ma nma; ha ji ǹtú, ji kwa otùtù, eme ya ka o sie ike, ka ọ we ghara isu ngọngọ.


Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.


Gini mere ndi nka nke Jerusalem ji adaghachi azu na ndaghachi-azu ebighi-ebi? ha ejidesiwo aghughọ ike, ha ajuwo ilọta.


Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.


Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n'ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n'ihi nsọpuru-ya, n'ihi na o siwo n'ebe ọ nọ je biri n'ala ọzọ.


Dika ha kpọrọ ha òkù, otú a ka ha puru n'iru ha nēje: Bealim ka ha churu àjà, surere arusi di iche iche apiri api ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Mma-agha gēfeghari kwa n'obodo-ya nile, me ka ihe-ntuchi-ya nile gwusia, ripia ha, site na ndum-ọdu nile ha.


Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere.


Ma ya onwe-ya amaghi na ọ bu Mu onwem nyere ya ọka-ya na manya-vine ọhu ya, na manu ọhu ya, me ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba, bú nke ha ji mere Beal ihe.


Onye ekekọtaworo n'arusi di iche iche ka Efraim bu; kwe ka ọ nọduru onwe-ya.


Ha onwe-ha edowo ndi-eze, ma ọ bughi site n'akam; ha edowo ndi-isi, ma amaghm: ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha ka ha jiworo mere onwe-ha arusi di iche iche, ka ewe bipu ha.


Ọ jusiwo nwa-ehi-gi, Sameria; iwem adiwo ọku megide ha: rùe ole mb͕e ka ha nāgaghi-enwe ike ighọ ndi nēmeghi ihe ọjọ?


N'ihi na Israel ka ọbuná ihe a si puta; onye-ọ̀kà mere ya, ọ bughi kwa Chineke ka ọ bu: n'ihi na umu-irighiri-ihe ka nwa-ehi Sameria gāghọ.


Ma, le, unu ebiliwo n'ọnọdu nna-unu-hà, nmuba nke ndikom, bú ndi-nmehie, iwere idi-ọku ọzọ tukwasi n'idi-ọku iwe Jehova megide Israel.


Ma gini ka ndum-ọdu Chineke nāgwa Ya? Arapurum nye Onwem nnù ndikom iri-na-asa na ọgu iri, madu ndi ọ dighi mb͕e ha b͕uru ikperè nye Beal.


ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n'ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;


Ma ajọ madu nile na ndi-aghughọ gānaga n'iru n'ijọkari njọ, nēduhie ndi ọzọ, anēduhie kwa ha.


Samuel we were karama manu, wukwasi ya n'isi-ya, sutu ya ọnu, si, Ọ̀ bughi na Jehova etewo gi manu ibu onye-ndú ihe-nketa-Ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan