Hosiya 13:16 - Bible Nso16 Sameria gāhu ahuhu ikpe-ọmuma-ya; n'ihi na ọ nupuwo isi n'okpuru Chineke-ya: site na mma-agha ka ha gāda; agātupia umu-ntakiri-ha, agāb͕awa kwa ndinyom-ha di ime afọ. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya, nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha. A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile, tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala, jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.” Faic an caibideil |
Ahurum Onye-nwe-ayi, ka Ọ nēguzo Onwe-ya n'akuku ebe-ichu-àjà-Ya: O we si, Tie isi-ogidi nile, ka nbata-uzọ nile we me nkpatu: tijisie ha n'isi ha nile; ma ndi-ikpe-azu nime ha ka M'gēji mma-agha b͕ue: onye-ha nke nāb͕alaga ab͕alaga agaghi-ab͕alaga; ọzọ, onye-ha nke nāb͕apu ab͕apu agaghi-ewepuga onwe-ya.