Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 13:15 - Bible Nso

15 Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n'etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n'ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile. Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere, ga-esi nʼọzara fekwasị ya. Isi iyi niile ga-ata, olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa. A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile, na akụ niile o nwere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 13:15
27 Iomraidhean Croise  

ma, le, oko ọka asa, nke kpọnwuru akpọnwu, nke fikpọ-kwa-ra afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọ-kwa-ra, nēpuso ha n'azu:


Aha nke-abua ka ọ kpọrọ Efraim: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'mua ọmùmù n'ala ewedaram ala.


Ma, le, oko ọka asa, nke fikpọrọ afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọkwara achakpọ, nēpuso ha n'azu.


Nna-ya we ju, si, Amawom, nwam, amawom: ya onwe-ya gāghọ kwa otù ndi, ya onwe-ya gādi kwa uku: ma otú ọ di, nwa-nne-ya nke-ntà gādi uku kari ya, nkpuru-ya gāghọ kwa ùjú nke mba nile.


Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu, Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi; Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi.


Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru, Agēbipu kwa alaka-ya n'elu.


Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.


Ka eriri-umu-ya diri nbipu; N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.


Dozierenu umu-ya ebe-ob͕ub͕u n'ihi ajọ omume nke ndi bu nna-ha; ka ha we ghara ibili, nweta uwa, me ka elu-uwa dum madu bi juputa n'obodo.


Mba di iche iche, dika nkpọtu nke miri di ike ka ha nākpọtu: ma Ọ nābasiri ya nba ike, o we b͕alaga n'ebe di anya, anāchi kwa ya dika ib͕ob͕o-ọka nke ugwu n'iru ifufe, na dika ihe anēfeghari buruburu n'iru oké ifufe.


N'ọtùtù, mb͕e I nēzilaga ya, ka Gi na ya nēse okwu: O jiwo ifufe-Ya siri ike wepu ya n'ubọchi ifufe Iru-anyanwu.


I gāfucha ha, ifufe gēfepu kwa ha, oké ifufe gēfesa kwa ha: ma gi onwe-gi gēteghari egwú ọṅù na Jehova, n'Onye Nsọ nke Israel ka i gānya isi.


M'gēnye kwa ihe nile akpakọbara n'obodo a, na ihe nile putara na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ihe-ya nile nke di oké ọnu-ahia, e, àkù nile nke ndi-eze Juda ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, ndi gāluta ihe-ha n'agha, chiri ha, chibà ha na Babilon.


Na mb͕e ahu ka agāsi ndi nka, si kwa Jerusalem, Ifufe di ọku, nke sitere n'ebe di elu nke ọhia nādighi ya nke di n'ọzara, nēfe n'uzọ ada ndim, ọ bughi ifucha afucha, ọ bughi kwa ime ka adi ọcha;


ifufe nke juru eju nke sitere n'ebe ndia gābiaram: ub͕u a Mu onwem gēkwu kwa ọkwu ikpé nile n'ebe ha nọ.


Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ifufe nke nēbibi ebibi megide Babilon, na n'ebe ndi bi na Leb-kamai nọ.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ikpe ọnu-gi, bọ̀ ọ́bọ̀-gi; M'gēme kwa ka oké osimiri-ya tasia, me kwa ka isi-iyi-ya takọrọ.


Ma, le, ebe akuworo ya, ìhe gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gaghi-akpọnwusi, mb͕e ifufe Iru-anyanwu nēfetu ya? nime nkpuru ebe o puru epu ka ọ gākpọnwu.


Ewe ropu ya n'ọnuma, n'ala ka atudara ya, ifufe Iru-anyanwu we me ka nkpuru-ya kpọnwua: ab͕ajipuru nkpa-n'aka-ya nile di ike, ha we kpọnwua; ọku ripiara ha.


ọzọ kwa, chi nile ha, ha na arusi nile ha akpuru akpu, tiyere ihe nile ha anāchọsi ike nke-uku nke ọla-ọcha na nke ọla-edo, ka ọ gādọta n'agha bata n'Ijipt; ma ya onwe-ya gēguzo arọ ufọdu ghara imegide eze Ugwu ahu.


Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.


ka M'we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n'ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua;


Ifufe apiakọtawo ya na nkù-ya; ihere àjà nile ha gēme kwa ha.


Efraim, dika anu-ufe ka nsọpuru-ha gēfepu: ọmumu-nwa na idi-ime na itu-ime ewe ghara idi.


O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


Lutanu ọla-ọcha n'agha lutanu ọla-edo n'agha: ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù edoziri edozi, bú ebube nke sitere n'ihe nile anāchọsi ike.


Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan