Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 11:5 - Bible Nso

5 Ọ gaghi-alaghachi n'ala Ijipt; ma onye Asiria ahu gābu eze-ya n'ihi na ha juru ilaghachi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 “Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt, Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha, nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 11:5
20 Iomraidhean Croise  

Pul, bú eze Asiria, we bia imegide ala ahu; Menahem we nye Pul nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri, ka aka-ya we diyere ya ime ka ala-eze di ike n'aka-ya.


N'ubọchi Peka, bú eze Israel, ka Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, biara, were Ijon, na Ebel-bet-meaka, na Janoa, na Kedesh, na Hezoa, na Gilead, na Galili, bú ala nile nke Naftali; o we me ka ha je biri n'Asiria.


Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n'Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel.


Efraim we hu ọria-ya, Juda hu-kwa-ra ọnyá-ya, Efraim we je Asiria, zigara eze, bú Jereb: ma onye ahu apughi igwọ unu, ọ gaghi-eme kwa ka ọnyá si n'aru-unu la.


Bianu, ka ayi laghachikute Jehova: n'ihi na Ya onwe-ya adọkawo, Ọ gāgwọ kwa ayi; O tib͕uwo, Ọ gēkechi kwa ayi.


Ha nālaghachi, ma ọ bughi Onye nọ n'elu ka ha nālaghachikute; ha di ka uta nāghọ aghughọ: ndi-isi-ha gāda site na mma-agha, site n'oké iwe nke ire-ha: nka bu ikwa-emò-ha n'ala Ijipt.


Àjà nile nke onyinyem nile, ha nāchu anu nàjà, we rie ya; ihe-ha adighi-atọ Jehova utọ: ub͕u a ka Ọ gēcheta ajọ omume-ha, leta nmehie nile ha; ha onwe-ha gālaghachi n'Ijipt.


Ha agaghi-ebi n'ala Jehova; ma Efraim gālaghachi n'Ijipt, ọ bu kwa n'Asiria ka ha gēri ihe ruru árú.


N'ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n'ulo-ikwū nile ha.


Akwatuwom ufọdu n'etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n'orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Mu onwem kwa, enyewom unu ezé nwuru enwu n'obodo nile unu, na ukọ nri n'ebe nile unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu jehova puta.


M'gēme kwa ka unu je biri n'ala ọzọ n'ofè Damaskọs, ka Jehova, Onye aha-Ya bu Chineke nke usu nile nke ndi-agha, siri.


Nání na ọ gaghi-eme ka inyinya bara ya uba, ọ gaghi-eme kwa ndi Israel ka ha laghachi n'Ijipt, ka o we me ka inyinya ba uba: n'ihi na Jehova asiwo unu, Unu alaghachi-kwa-la n'uzọ ahu ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan