Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 11:1 - Bible Nso

1 Mb͕e Israel bu nwata, ahurum ya n'anya, ọ bu kwa site n'Ijipt ka M'kpọputara nwam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 “Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya, ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 11:1
18 Iomraidhean Croise  

Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata, Biko, ka Israel kwue otú a, si,


Unu onwe-unu ahuwo ihe M'mere ndi Ijipt, ebu-kwa-ram unu n'elu nkù ugo, me ka unu biakutem.


I gāsi kwa Fero, Otú a ka Jehova siri, Nwam, bú ọkparam, ka Israel bu:


M'we si gi, Zipu nwam, ka ọ we fèm; i we ju izipu ya: le, Mu onwem gaje ib͕u nwa-gi, bú ọkpara-gi.


Ebe i ghọworo ihe di oké ọnu-ahia n'anyam, ebe asọpuruwo-kwa-ra gi, ebe Mu onwem huwokwara gi n'anya; ya mere M'gēnye madu n'ọnọdu gi, nye kwa ndi di iche iche n'ọnọdu ndu-gi.


Arapuwom ulom, ajuwom ihe-nketam; ewerewom nwayi nke ihe-ya nātọ nkpuru-obim utọ nke-uku nye n'ọbu-aka ndi-iro-ya.


Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n'ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n'anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n'ọzara, n'ala anāghaghi nkpuru.


Ma n'ihe-árú-gi nile na ikwa-iko-gi nile i chetaghi ubọchi nile mb͕e i di na nwata, mb͕e i b͕asiri ọtọ, onye anāzọtọ n'ọbara-gi ka i bu kwa.


M'we gabiga n'akuku gi, hu gi ka anāzọtọ gi n'ọbara-gi, M'we si gi, Ọ bu ezie na i nọ nime ọbara-gi, di ndu; e, asirim gi, Ọ bu ezie na i nọ nime ọbara-gi, di ndu.


Otú a ka Bet-el gēme unu n'ihi ihe ọjọ unu nke kachasi ihe ọjọ nile: na chi-ọbubọ ka agēme ka eze Israel lasia n'iyì.


Ọ bu kwa onye-amuma ka Jehova jiri me ka Israel si n'Ijipt rigoputa, ọ bu kwa onye-amuma ka ejiri debe ya.


Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; M'gēme kwa ka i biri n'ulo-ikwū ọzọ, dika n'ubọchi nile nke mb͕e akara àkà.


Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; ọ dighi kwa chi, ma-ọbughi náním, i gāmara, onye-nzọputa adighi kwa, ma-ọbughi náním.


M'gēsi kwa n'ebe ahu nye ya ubi-vine-ya nile, na ndagwurugwu Ekoa ibu ọnu-uzọ olile-anya: ọ gāza kwa n'ebe ahu, dika n'ubọchi nile ọ di na nwata, na dika n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.


Ahuwom unu n'anya, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka I huworo ayi n'anya? Isọ, ọ̀ bughi nwa-nne Jekob? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): otú ọ di, anamahu Jekob n'anya;


O we nọ n'ebe ahu rue ọnwu Herod: ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si, Site n'Ijipt ka M'kpọputara Nwam.


E, Ọ nāhu ndi nke Ya nile n'anya; Ndi nsọ Ya nile di n'aka-gi: Ndi ahu we nọdu ala n'ukwu-gi; Onye ọ bula gānata ufọdu nime okwu-gi.


Ọ bughi na unu bara uba kari ndi nile ka Jehova huru unu n'anya si-ike, we rọputa unu; n'ihi na unu onwe-unu di ole-na-ole kari ndi nile ọzọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan