Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 10:12 - Bible Nso

12 Gharanu onwe-unu nkpuru n'ezi omume, wenu ihe-ubi dika ebere si di; lucharanu onwe-unu ubi: n'ihi na ọ bu mb͕e ichọ Jehova, rue mb͕e Ọ gābia, zokwasi unu ezi omume dika miri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu, unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya. Kọgharịakwanụ obi unu siri ike, nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ bịara wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 10:12
33 Iomraidhean Croise  

Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile.


Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n'ọzara asuru asu: Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala.


Onye nēmebi iwu nāluta ego-ọlu okwu-ugha: Ma onye nāgha ezi omume dika nkpuru nāluta ugwọ-ọlu kwesiri ntukwasi-obi.


Ọnwu na ndu di ire n'aka; Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.


Gha nkpuru-gi n'ututu, ewepu-kwa-la aka-gi n'anyasi: n'ihi na i dighi-ama nke gāgazi agazi, ma ọ bu nka ma-ọbu nke-ọzọ, ma-ọbu na ha abua gādi nma otù aka ahu.


Ọ gēnye kwa míri-ozuzo nke nkpuru-ọghigha-gi, nke i gāgha n'ala-ubi-gi; na achicha nke ihe-omume nke ala-ubi, ọ gāma kwa abuba, ba uba: n'ubọchi ahu anu-ulo-gi nile gāta nri n'ebe-íta-nri sara mbara.


Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n'Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n'ub͕ọ-ala, n'ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n'ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova!


Ndi ihe nāgara nke-ọma ka unu ndi nāgha nkpuru n'akuku miri nile bu, ndi nēziputa ukwu ehi na inyinya-ibu.


N'ihi na M'gāwukwasi miri n'aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n'ala-akọrọ: M'gāwukwasi Mọm n'aru nkpuru-gi, na ngọzim n'aru umu i muru:


Unu elu-igwe, nātasinu ezi omume site n'elu, ka mbara-ígwé nile nēzoda kwa ezi omume dika miri: ka ala meghe onwe-ya, ka ha we mia nzọputa dika nkpuru, ka o me kwa ezi omume ka ọ pukọ n'otù; Mu onwem, bú Jehova, ekèwo ya.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i ṅarari nti n'ihe nile M'nyere n'iwu! udo-gi ewe diwori ka osimiri, ezi omume-gi adi kwa ka nmali-miri nile nke oké osimiri:


m'gēme kwa ka ọ gwusia; agaghi-akwacha vine-ya, agaghi-edozi kwa ya; ma ogwu na uke gētoputa: igwe-oji nile ka m'gēnye kwa iwu ka ha ghara izokwasi ya miri.


N'ezi omume ka agēme ka i guzosie ike: gi nọpu nmeb͕u n'ebe di anya, n'ihi na i gaghi-atu egwu; nọpu kwa ihe-ujọ n'ebe di anya, n'ihi na ọ gaghi-abiaru gi nso.


Chọnu Jehova mb͕e anāchọta Ya, kpọkuenu Ya mb͕e Ọ nọ nso:


N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), umu Israel gābia, ha onwe-ha na umu Juda n'otù; ha ganēje ije nākwa ákwá, ọ bu kwa Jehova, bú Chineke-ha, ka ha gāchọ.


M'gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M'gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi.


Ma gi onwe-gi, nime Chineke-gi ka i gālata: debe ebere na ikpé ziri ezi, le kwa anya Chineke-gi mb͕e dum.


Israel, laghachikute Jehova, bú Chineke-gi; n'ihi na i suwo ngọngọ site n'ajọ omume-gi.


Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.


N'ihi na ifufe ka ha nāgha dika nkpuru-ọghigha, ọ bu kwa oké ifufe ka ha gēwe dika ihe-ubi: ọ dighi ọka guzoro eguzo o nwere; ihe-opupú agaghi-eme utu ọka; ọ buru na o me ma eleghi anya, ndi ala ọzọ gēloda ya.


Kpọnu ihe ọjọ asì, hunu ezi ihe n'anya, menu ikpé ziri ezi ka o guzosie ike n'ọnu-uzọ-ama: eleghi anya Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, gēmere ndi Josef fọduru amara.


N'ihi na otú a ka Jehova siri ulo Israel, Chọnum, we di ndu:


Chọnu Jehova, we di ndu; ka O we ghara ibia ike ike dika ọku n'ulo Josef, o we ripia, ọ gaghi-adi kwa onye nēmenyu ya nime Bet-el:


chọnu Onye nēme Pleiades na Orion, Nke nāb͕anwe onyinyo ọnwu ka ọ ghọ ututu, Nke nēme kwa ka ehihie b͕a ọchichiri dika abali; Onye ahu Nke nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha ala; Jehova bu aha-Ya;


Jisienu ike isi n'ọnu-uzọ di warara ba: n'ihi na ọtutu madu, ka M'si unu, gāchọ ibà nime ya, ma ha agaghi-enwe ike.


E, n'aru ndi-orùm ndikom na n'aru ndi-orùm ndinyom Ka M'gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma.


Ma Onye ahu Nke nwere inyezu onye nāgha nkpuru nkpuru-ya, Onye nwe-kwa-ra inyezu madu nri ka o rie, Onye ahu gēnyezu unu nkpuru-ọghigha-unu, me kwa ka ha ba uba, Ọ gēme kwa ka nkpuru ezi omume-unu rie nne kari:


Ma ọ bu nkpuru nke ezi omume ka ndi nēme udo nāgha n'udo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan