N'ubọchi Peka, bú eze Israel, ka Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, biara, were Ijon, na Ebel-bet-meaka, na Janoa, na Kedesh, na Hezoa, na Gilead, na Galili, bú ala nile nke Naftali; o we me ka ha je biri n'Asiria.
n'ihi na onye nāpunara ya ihe-ya ab͕iakwasiwo obodo ahu, bú Babilon, ejidewo kwa ndi-dike-ya, ab͕ajisiwo uta nile ha: n'ihi na Chineke nke nēmeso madu otú ha si eme ka Jehova bu, Ọ ghaghi ikwughachi.
N'ubọchi ahu Mu na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe na ihe nākpu akpu nke ala gāb͕ara ha ndu: ọ bu kwa uta na mma-agha na agha ka M'gāb͕ajipu n'ala-ha, me ka ha dina ala na ntukwasi-obi.
Umu Josef we si, Ugwu a ezughi ayi: ma ub͕ọ-ala ígwè di n'aka ndi Kenean nile ndi bi n'ala ndagwurugwu, ma ndi bi na Bet-shean na umu-obodo-ya, ma ndi bi na Jezreel.