Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hosiya 1:1 - Bible Nso

1 Okwu Jehova nke ruru Hosea nwa Beeri nti n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Okwu Onyenwe anyị nke bịakwutere Hosiya nwa Beiri nʼoge Uzaya, na Jotam, na Ehaz, na Hezekaya, bụ ndị eze Juda, na nʼoge Jeroboam nwa Jehoash bụ eze nʼIzrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hosiya 1:1
26 Iomraidhean Croise  

Joash we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Jeroboam we nọkwasi n'oche-eze-ya: ewe lìe Joash nime Sameria n'ebe elìri ndi-eze Israel.


Jehoash we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya nime Sameria n'ebe elìri ndi-eze Israel; Jeroboam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


N'aro nke-iri-na-ise nke Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, ka Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, malitere ibu eze na Sameria ọgu arọ abua na otù.


N'arọ nke-abua nke Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, ka Jotam nwa Uzaia, bú eze Juda, malitere ibu eze.


Jehova we tie eze ahu ihe, o we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche. Ma Jotam nwa eze bu onye-isi ulo-ya, nēkpe ndi ala ahu ikpe.


Azaraia we so nna-ya-ha dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Jotam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


Orú arọ na ise ka Jotam b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok.


Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika Devid nna-ya:


Ihe edoro nsọ di kwa nnù oke-ehi na ọgu iri, na nnù aturu asa na ọgu iri.


Ọhù Aisaia nwa Emoz, nke ọ huru bayere Juda na Jerusalem n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda.


O rue, n'ubọchi Ehaz nwa Jotam, nwa Uzaia, bú eze Juda, na Rezin, bú eze Siria, rigoro, ya na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rue Jerusalem, ibu agha megide ya; ma ọ pughi ibu agha megide ya.


onye okwu Jehova ruru nti n'ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda, n'arọ nke-iri-na-atọ ọ bu eze.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


okwu Jehova ruru Ezikiel nwa Buzi, bú onye-nchu-àjà, nti n'ezie n'ala ndi Kaldea, n'akuku osimiri Keba; aka Jehova we di ya n'aru n'ebe ahu.


Okwu Jehova nke ruru Joel, nwa Petuel, nti.


Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.


Okwu Jehova we rue Jona nwa Amitai nti, si,


Okwu Jehova nke ruru Maika, bú onye Moreshet, nti, n'ubọchi Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, bú okwu nke ọ huru bayere Sameria na Jerusalem.


N'ọnwa nke-asatọ, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, ka okwu Jehova ruru Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si,


Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n'akwukwọ nso),


Dika O nēkwu kwa n'akwukwọ Hosea, si, M'gākpọ ndi ahu ndim, nke nābughi ndim; M'gākpọ kwa nwanyi ahu onye ahuru n'anya, nke anāhughi n'anya.


N'ihi na ọ dighi amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mb͕e ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwue okwu, mb͕e Mọ Nsọ nēme ka ha kwue.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan