Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hegai 2:21 - Bible Nso

21 Gwa Zerubabel, bú onye nāchi ala Juda, okwu, si, Mu onwem gaje ime ka elu-igwe na uwa me nkpatu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 “Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hegai 2:21
14 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Pedaia kwa; Zerubabel, na Shimai: umu-ndikom Zerubabel kwa; Meshulam, na Hananaia; Shelomit bu nwa-nne-ha nwayi:


ndi ahu soro Zerubabel bia: bú Jeshua, Nehemaia, Seraia, Reelaia, Mọdekai, Bishan, Mispa, Bigvai, Rehum, Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:


Mb͕e ahu Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak, biliri, we malite iwu ulo Chineke nke di na Jerusalem; ndi-amuma Chineke nọye-kwa-ra ha, nēnye ha ume.


Mba nile ozo b͕ara aghara, ewezugara ala-eze nọnọdu-ha: O mere ka olu-Ya da, uwa nabaze.


Nkpù-iru, nkpù-iru, nkpù-iru ka M'gēkpù-ya: nka kwa, ọ gaghi-adi rue mb͕e ọ gābia, bú onye o ruru aka; M'gēwere kwa ya nye ya.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Taia: Ọ̀ bughi site n'olu ọdida-gi, mb͕e ndi emeruru emeru nāsu ude, mb͕e anēb͕u eb͕u nke-uku n'etiti gi, ka agwe-etiti nile nēme nkpatu?


Jehova gēsi kwa na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; elu-igwe na uwa gēme kwa nkpatu: ma Jehova gāburu ndi-Ya ebe-nb͕abà, Ọ gābu-kwa-ra umu Israel ebe siri ike.


N'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi mbu n'ọnwa, ka okwu Jehova si n'aka Hagai, bú onye-amuma, rue Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, ru kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, nti, si,


Jehova we kpọte mọ Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, na mọ Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na mọ nke ndi Israel nile fọduru; ha we bia je ozi n'ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan