Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hegai 2:12 - Bible Nso

12 Le, ọ buru na onye ọ bula eburu anu nsọ n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya, were kwa ọnu-ọnu-ala nke uwe-ya metu achicha, ma-ọbu ofé, ma-ọbu manya-vine, ma-ọbu manu, ma-ọbu ihe-oriri ọ bula, ọ̀ gādi nsọ? Ndi-nchu-àjà we za, si, É-è.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ọ bụrụ na mmadụ etinye anụ e doro nsọ nʼakpa uwe ya, ọ bụrụkwa na uwe ahụ anụ nsọ ahụ dị nʼime ya emetụ achịcha, maọbụ ofe, maọbụ nri ọzọ dị iche, mmetụ uwe ahụ metụrụ ha ọ ga-eme ka ha dịrị nsọ?’ ” Ndị nchụaja zara sị: “Mba!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hegai 2:12
8 Iomraidhean Croise  

Ubọchi asa ka i gēkpuchi nmehie n'elu ebe-ichu-àjà ahu, we do ya nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu kwa ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: ihe ọ bula nke nēmetu ebe-ichu-àjà ahu aru gādi nsọ.


Ijiji nwuru anwu nēme ka manu onye nāsugwa manu-otite nke nēsì ísì utọ sìe ísì ọjọ, re kwa ure: otú a ka nzuzu ntà di arọ́ kari amam-ihe, kari kwa nsọpuru.


Ma mb͕e ha nāpu n'ogige di n'èzí, bú ogige di n'èzí ipukuru ndi Israel, ha gēyipu uwe nile ha, nke onwe-ha nēje ozi nime ha, ha gādọba kwa ha n'ime-ulo nsọ ndia, yiri uwe ọzọ, ka ha we ghara iji uwe-ha do ndi Israel nsọ.


Ihe ọ bula nke nēmetu anu-ya aru gādi nsọ: mb͕e efesara ufọdu nime ọbara-ya n'uwe ọ bula, i gāsu kwa ihe ahu efesara ya n'elu ya n'ebe di nsọ.


Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.


Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: n'ebe di nsọ ka agēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.


Ndi-ìsì: n'ihi na òle nke ka uku, ihe-onyinye, ma-ọbu ebe-ichu-àjà nke nēdo ihe-onyinye ahu nsọ?


Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile, Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel: Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi, Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan