Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Hegai 1:11 - Bible Nso

11 M'we kpọ oge ọkpukpọ-nku ka ọ dakwasi ala nka na ugwu-ya nile na ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya na ihe nile nke ala nēpuputa na madu na anumanu na ihe nile unu dọb͕uru onwe-unu n'ọlu inweta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Hegai 1:11
13 Iomraidhean Croise  

Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.


Ma Elaisha gwara nwayi ahu okwu, bú onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu, si, Bilie, je, gi onwe-gi na ulo-gi, nọ dika ọbìa n'ebe ọ bula i gānọ dika ọbìa: n'ihi na Jehova akpọwo oké unwu ka ọ da: ọzọ kwa, ọ gābiakwasi ala arọ asa.


Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe? Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya? Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu:


Juda eruwo újú, ọnu-uzọ-ama-ya nile atalatawo kwa, ha yiri uwe-nkpe nọdu n'ala; iti-nkpu Jerusalem arigowo.


Ha anuwo na onye nēze ume ka m'bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m'nwere; Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya: I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem.


chọnu Onye nēme Pleiades na Orion, Nke nāb͕anwe onyinyo ọnwu ka ọ ghọ ututu, Nke nēme kwa ka ehihie b͕a ọchichiri dika abali; Onye ahu Nke nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha ala; Jehova bu aha-Ya;


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m'hu: ma, le, Jehova nākpọ òkù ka Ya na ndi-Ya kpe ikpe site n'ọku; o we ripia oké ob͕u-miri, we nēripia òkè a, bú ala Israel.


Onye nēwu ime-ulo-elu-Ya nile n'elu-igwe, ma mbara-ígwé-Ya, n'elu uwa ka Ọ tọworo ntọ-ala-ya; Onye nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha n'ala; Jehova bu aha-Ya.


Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, ji kwa ákú-miri-ígwé, tib͕ue unu n'ọlu nile nke aka-unu; ma ọ dighi nchighari unu chigharikuterem; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Nkpuru-ọghigha, ọ̀ di n'ọba rue ub͕u a? ọzọ kwa, osisi vine na osisi fig na osisi pomegranate na osisi olive amighi nkpuru; site n'ubọchi ta ka M'ganāgọzi unu.


M'gābasi-kwa-ra ihe nēripia eripia nba ike n'ihi unu, ọ gaghi-ebibi-kwa-ra unu nkpuru ala-ubi-unu; osisi vine unu agaghi-atupu nkpuru-ya n'ubi tutu oge-ya eru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile.


Jehova gēwere ọtita-aru, were kwa aru-ọku, were kwa nruru-ọku, were kwa oké okpom-ọku, were kwa mma-agha, were kwa nchakpọ, were kwa ọmuma-ebù, tib͕ue gi; ha gāchu kwa gi rue mb͕e i gāla n'iyì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan