M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro.
Ndi Israel we di ka ndi nātamu ntamu, nēkwu ihe ọjọ na nti Jehova: Jehova we nu ya, iwe-Ya we di ọku; ọku nke Jehova we re n'etiti ha, we ripia madu ufọdu nime nsọtu ọmuma-ulo-ikwū.