Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Habakuk 3:13 - Bible Nso

13 I putawo ìhè izọputa ndi-Gi, Izọputa onye-Gi etere manu; I mabipuwo isi n'ulo ndi nēmebi iwu, B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu. Selah

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ị pụtara ịzọpụta ndị gị, ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ. Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ, gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Habakuk 3:13
26 Iomraidhean Croise  

Devid we biarue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; o we si, Jehova ekwopuwo megide ndi-irom n'irum, dika nkwopu miri. N'ihi nka ka ọ kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.


Si, Unu emetula ndim etere manu aka, Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam.


O zigara Moses, bú orù-Ya, Na Eron onye Ọ rọputara.


Ọ gēkpe ikpe n'etiti mba nile, Ebe nile juputara n'ozu; Ọ mapúwo isi madu n'elu ọtutu ala.


Jehova, cheta ubọchi Jerusalem Megide umu Edom; Ndi nāsi, B͕abanu ya ọtọ, b͕abanu ya ọtọ, Rue ntọ-ala di nime ya.


Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu; O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-Ya Za ya site nelu-igwe-Ya di nsọ.


Jehova buru ya ike, Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu.


Chineke, mb͕e I putara ga n'iru ndi-Gi, Mb͕e I zọbigara ije n'ala tọb͕ọrọ n'efu; Selah


I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu, Site n'aka Moses na Eron.


Moses na Eron n'etiti ndi-nchu-àjà-Ya, Samuel kwa n'etiti ndi nākpọku aha-Ya; Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha.


Ndi-Ya we cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga nke Moses, si, Òle ebe Onye ahu nọ nke mere ka ha si n'oké osimiri rigoputa n'aka onye nāzù ìgwè ewu na aturu-Ya? òle ebe Onye ahu nọ nke tiyere Mọ Nsọ Ya n'etiti ha?


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I gādọwa elu-igwe, ridata, ma asi na ugwu nile gēsi n'iru Gi rùda dika miri;


M'gākwatu kwa mb͕idi ahu nke unu teworo nzu, M'gēme kwa ka ọ darue ala, ewe kpughepu ntọ-ala-ya: ọ gāda kwa, agēme kwa ka unu gwusia n'etiti ya; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Ahurum Onye-nwe-ayi, ka Ọ nēguzo Onwe-ya n'akuku ebe-ichu-àjà-Ya: O we si, Tie isi-ogidi nile, ka nbata-uzọ nile we me nkpatu: tijisie ha n'isi ha nile; ma ndi-ikpe-azu nime ha ka M'gēji mma-agha b͕ue: onye-ha nke nāb͕alaga ab͕alaga agaghi-ab͕alaga; ọzọ, onye-ha nke nāb͕apu ab͕apu agaghi-ewepuga onwe-ya.


O rue, mb͕e ha si n'iru Israel b͕alaga, mb͕e ha nọ na nrida Bet-horon, na Jehova si n'elu-igwe tudakwasi ha nkume uku rue Azeka, ha we nwua: ndi nwuru na nkume ákú-miri-ígwé ahu kariri ndi umu Israel were mma-agha b͕ue.


O rue, mb͕e ha mere ka eze ise ahu pukute Joshua, na Joshua kpọrọ ndikom nile nke Israel, si ndi-ọchi-agha nke ndikom agha ndi soro ya je, Bianu nso, zọkwasinu ukwu-unu n'olu eze ndia. Ha we bia nso, zọkwasi ukwu-ha n'olu-ha.


Eze ndia nile na ala-ha ka Joshua were n'otù mb͕e, n'ihi na Jehova, bú Chineke Israel, nēburu Israel agha.


Obodo nile nke ndi-eze ahu, na eze-ha nile, ka Joshua were, o were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga ha ka ebibie ha; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu.


Jehova we nye ha n'aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n'akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan