Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Habakuk 2:6 - Bible Nso

6 Ndia, hà nile agaghi-atu ilu megide ya, na okwu miri emi, ọbuná okwu omimi di iche iche, bayere ya, si, Ahuhu diri onye ahu nke nēme ka ihe nābughi nke ya ba uba! rùe ole mb͕e? onye ji ihe-ibe ebob͕u onwe-ya!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 “Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya, “ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi, ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Habakuk 2:6
25 Iomraidhean Croise  

Jehova, rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu, Rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu gāṅuri ọṅu-agha?


Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba, Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.


N'ihi na ọ siwo, Site n'ike akam ka m'meworo ya, na site n'amam-ihem; n'ihi na enwerem nghọta: m'we wezuga ókè ndi nile di iche iche, ọzọ, ihe-ha nke ejikereworo ka m'punara ha, m'we buda, dika onye di ike, ndi nānọdu n'ọche-eze;


Ọ bu onye ji ntu azù onwe-ya: obi akwara emò ewezugawo ya, o we ghara inaputa nkpuru-obi-ya, ma ọbu isi, Ọ̀ bughi okwu-ugha, bú ihe di n'aka-nrim?


Ahuhu gādiri ndi nātukwasi ulo n'ulo, ndi nēme ka ubi rue ubi nso, rue mb͕e ọnọdu adighi kwa ọzọ, ewe me ka nání unu biri n'etiti ala!


N'ìhi gini ka unu nātù ego inye n'ọnọdu ihe nābughi nri? nà ihe putara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọnọdu ihe nke nādighi-eju afọ? genum nti nke-ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abuba tọ kwa nkpuru-obi-unu utọ.


Dika ọkwa nke nēkpokọba umu nke ọ nāmughi, otú a ka onye nākpa àkù, ma ọ kpaghi ya n'ikpé ziri ezi, si di; n'etiti ubọchi ndu-ya ọ gārapu ya, n'ikpe-azu-ya o we buru onye-nzuzu.


agēsite kwa na ha bulie nkọcha, nke ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ ndi nọ na Babilon gēji kọcha, si, Jehova me gi ka i di ka Zedekaia na dika Ehab, ndi eze Babilon rub͕uru n'ọku:


Site n'iwe Jehova madu agaghi-ebi nime ya, ma ọ gābusi ebe tọb͕ọrọ n'efu; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku Babilon anya, ọ gāma ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.


Ndi di ike nke ndi-dike gēsi n'etiti ala-mọ gwa ya okwu, ha na ndi nēyere ya aka: ha aridawo, ha edinawo ala, bú ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u.


N'ubọchi ahu ka agātu ilu megide unu, gosie ákwá ike, si: Apunarisiwo ayi ihe: òkè ndim ka Ọ nāb͕anwe: le ka O si ewepurum ya nke-uku! ọ bu onye nke nādaghachi azu ka Ọ nēkère ubi nile ayi.


Ha nile ka o ji nkò-azù dọkpuru, o nēkpochapu ha n'eriri-ya, chikọta ha n'ub͕u-ya: n'ihi nka ka ọ nāṅuri, tegharia egwú ọṅù.


Ahuhu diri onye ji ọbara ewu obodo, onye ji kwa ajọ omume me ka obodo guzosie ike!


Le, ò siteghi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha na ndi di iche iche nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nye ọku, na ike nāgwu kwa mba nile n'efu?


Ọ we tua ilu-ya, si, Bilie, Belak, nuru kwa; Ṅam nti, nwa Zipoa:


O we tua ilu-ya, si, N'Eram ka Belak nēsi dutem, Eze Moab si n'ugwu Iru-anyanwu dutem: si, Bia, buaram Jekob ọnu, Bia kwa, wesa Israel iwe.


Ma Chineke siri ya, Onye nēnweghi uche, n'abali a ka anāchọ mkpure-obi-gi n'aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha?


Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan