Habakuk 2:19 - Bible Nso19 Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a19 Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’ Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’ O nwere ike izi mmadụ ihe? Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie, ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.” Faic an caibideil |
N'ihi nka, n'otù mb͕e ahu, mb͕e ndi nile di iche nuru olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke ubọ na opì nile di iche iche, ha we nāda n'ala, bú ndi nile di iche iche, na mba nile di iche iche, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ha we nākpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ.
ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh: