Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Habakuk 2:16 - Bible Nso

16 Afọ ihere ejuwo i kari nsọpuru: ṅua, ọbuná gi onwe-gi, ghọ onye anēbìghi úgwù: iko aka-nri Jehova gēchighari rue gi aru, ihere nke jọb͕uru onwe-ya gādi kwa n'elu ebube-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Habakuk 2:16
21 Iomraidhean Croise  

N'ihi na iko di n'aka Jehova, manya-vine nke di nime ya asuwo ufufu; O juputara na manya ejiri ihe gwa, O we si na nke ahu b͕aputa manya: N'ezie ọru-ala-ya nile, ndi nile n'uwa ndi nēmebi iwu gāzaputa ya ṅua.


Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa; Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.


otú a ka eze Asiria gēdulaga ndi Ijipt adọtara n'agha, na ndi Etiopia emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma umu ntà ma ndi-okenye, b͕ara ọtọ na ukwu efu, b͕a kwa ọtọ n'otule, ib͕aba Ijipt ọtọ.


Agēkpughe ọtọ-gi, e, agāhu ita-uta-gi: ọ́bọ̀ ka M'gābọ̀, M'gaghi-ezute madu.


M'gēme kwa ka ndi nēme gi ihe-ike rie anu-aru onwe-ha: ha gāṅubiga kwa ọbara onwe-ha ókè, dika ọ bu manya-vine ọhu: anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi, na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.


N'ihi na otú a ka Jehova, bu Chineke nke Israel, sirim: Nara iko manya nke ọnuma nka n'akam, me ka mba nile ṅua ya, bú ndi Mu onwem nēziga gi jekuru.


M'we nara iko ahu n'aka Jehova, me ka mba nile ṅua, bú ndi Jehova zigaram jekuru:


M'gēme kwa ndi-isi-ya, na ndi-ya mara ihe, na ndi-ya nāchi ala, na ndi-ya nọchiri anya eze, na ndi-dike-ya, ka ha ṅubiga manya ókè; ha gāraru kwa ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Iko ọla-edo ka Babilon buworo n'aka Jehova, nke nēme ka uwa nile ṅubiga manya ókè: ufọdu nime manya-vine-ya ka mba di iche iche ṅuworo; n'ihi nka ka mba di iche iche nāwi ara.


Ka obi nātọ gi utọ, ṅuria ọṅu, gi ada Edom, nke bi n'ala Uz: Ọbuná gi ka iko gāgabigaru: i gāṅubiga manya ókè, b͕aba onwe-gi ọtọ.


N'iṅubiga-manya-ókè na ihe-nb͕u ka i gējuputa, n'iko ihe-iju-anya na itọb͕ọrọ-n'efu, n'iko nwa-nne-gi nwanyi, bú Sameria.


Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M'gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere.


N'ubọchi eze-ayi ndi-isi jiri idi-ọku nke manya-vine ria ọria; o soro ndi nākwa emò setia aka-ya.


I duworo ulo-gi ọdu ihere, ibipu ọtutu ndi di iche iche, i we nēmehie megide nkpuru-obi-gi.


Ahuhu diri onye nēme ka madu-ibe-ya ṅua ihe, onye nāgwakọta ya na ọnuma-gi, ọzọ, i nēme kwa ka ọ ṅubiga manya ókè, ka i we legide ọtọ-ha anya!


ndi ọgwugwu-ha bu ila-n'iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n'ihere-ha, ndi nātukwasi uche n'ihe uwa.


Nyeghachinu ya ọbuná dika ya onye-ya nyeghachiri madu, nye-kwa-nu ya okpukpu abua dika ọlu-ya nile di: nime iko ahu ọ kwara akwa, kwaranu ya okpukpu abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan