Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Habakuk 2:10 - Bible Nso

10 I duworo ulo-gi ọdu ihere, ibipu ọtutu ndi di iche iche, i we nēmehie megide nkpuru-obi-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ, sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Habakuk 2:10
16 Iomraidhean Croise  

Eze, bú Solomon, we were Jehova ṅua iyi, si, Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ọ bughi imegide ndu-ya ka Adonaija kwuworo okwu a.


O rue, mb͕e akwukwọ ahu bara ha n'aka, na ha chiri umu eze, b͕ue ha, bú ọgu ndikom atọ na iri, tiye isi-ha nime nkata, zigara ya rue Jezreel.


N'ezie ahuwom ọbara Nebot na ọbara umu-ya ndikom n'abali hnyahuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gākwughachi kwa gi n'òkè-ala-ubi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ma ub͕u a bulie ya, tubà ya n'òkè-ala-ubi ahu, dika okwu Jehova si di.


Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu, Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.


Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu: Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya.


Ma onye nēmehie megidem nēme nkpuru-obi-ya ihe-ike: Ndi nile nke nākpọm asì nāhu ọnwu n'anya.


Unu gātu ime ahihia kpọrọ nku, unu gāmu ahihia-ọka: nku-ume-unu bu ọku nke gērichapu unu.


Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n'akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n'ubọchi-ya nile: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n'oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.


Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi.


M'gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M'gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M'gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda.


Ma ub͕u a otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ìhi gini ka unu onwe-unu nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi unu, ibipu n'ulo-unu nwoke na nwanyi na nwatakiri na nwa nāṅu ara, ka ha pua n'etiti Juda, ewe me ka ọ ghara idi ndi fọduru gāfọduru unu;


Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n'aha-gi: n'ulo chi-gi nile ka M'gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M'gēdo ílì-gi; n'ihi na elelìwo gi anya.


Afọ ihere ejuwo i kari nsọpuru: ṅua, ọbuná gi onwe-gi, ghọ onye anēbìghi úgwù: iko aka-nri Jehova gēchighari rue gi aru, ihere nke jọb͕uru onwe-ya gādi kwa n'elu ebube-gi.


bú ihe-igu-ọku nke ndi-nmehie ndia ndi megidere nkpuru-obi-ha, ka ewere kwa ha kpu mbadamba ihe ibu ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà: n'ihi na ha wetara ha nso n'iru Jehova, ha di kwa nsọ: ha gābu-kwa-ra umu Isael ihe-iriba-ama.


Ndi-Ju nile we za, si, Ọbara-Ya di ayi n'isi, di kwa n'isi umu-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan