Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Habakuk 2:1 - Bible Nso

1 N'elu ebe m'nēche ka m'gēguzo, guzo kwa onwem n'elu ebe ewusiri ike, m'gēche kwa ihu ihe Ọ gēkwu megidem, na ihe m'gāzaghachi bayere iba-nbam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m, guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ. Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m, na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Habakuk 2:1
23 Iomraidhean Croise  

Ma Devid nānọdu n'etiti ọnu-uzọ-ama abua ahu: onye-nche we jerue elu-ulo ọnu-uzọ-ama rue mbidi obodo, we welie anya-ya, hu, ma, le, otù nwoke nāb͕a ọsọ nání ya.


Umu Israel we were nzuzo me ihe nke nēzighi ezi megide Jehova, bú Chineke-ha, ha we wuere onwe-ha ebe di elu n'obodo-ha nile, site n'ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.


Ma onye-nche nēguzo n'elu ulo-elu na Jezreel, ọ hu ìgwè ndi Jihu mb͕e ọ nābia, ọ si, Ìgwè madu ka m'nāhu. Jehoram we si, Were onye-inyinya, ziga izute ha, ya si kwa, Ùdo di kwa?


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti! (Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam;) Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu!


M'gēgosi Ya ọnu-ọgugu nzọ-ukwum; Dika onye-ndú ka m'gābiaru Ya nso.


Jehova, n'ututu ka I gānu olum; N'ututu ka m'gēdoro Gi ekperem n'usoro, che kwa nche.


M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu: N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo: Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu.


Otú ọ di, nzọputa-Ya di nso ndi nātu egwu Ya; Ka nsọpuru we biri n'ala-ayi.


Ha nēdozi table, che nche, rie ihe, ṅua ihe-ọṅuṅu: bilienu, ndi-isi, tenu ọta manu.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Je, guzo onye-nche: ihe ọ gāhu ka ọ gēgosi:


O we kpọ dika ọdum: si, Onye-nwe-ayi, n'elu ulo-nche ka mu onwem nēguzo mb͕e nile n'ehihie, na nchem ka anēme ka mu onwem guzo n'abali nile:


N'elu mb͕idi-gi nile, Jerusalem, ka M'doworo ndi-nche; ogologo ubọchi nile ehihie na abali, mb͕e nile, ha agaghi-edebe ọnu-ha du: unu ndi nēchetara Jehova ihe, unu ederela du,


Onye ezi omume ka I bu, Jehova, mb͕e mu na Gi nēkperita ikpe: ma otú ọ di, okwu ikpem nile ka m'gēkwu n'ebe I nọ: gini mere uzọ ndi nēmebi iwu ji agara ha nke-ọma? gini mere ndi nile nāghọb͕u nke-uku ji anọ n'udo?


Eme-kwa-ram ka ndi-nche biliere unu, si, Ṅanu nti olu opì-ike; ha we si, Ayi agaghi-aṅa nti.


Nwa nke madu, Onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel: i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel; i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.


Ma mu onwem, nime Jehova ka m'gēche nche nke-ọma; M'gēchere Chineke nke nzọputam: Chinekem gānu olum.


ebe unu nāchọ ihe inwaputa Kraist Onye nēkwu okwu nimem; Onye nābughi onye nādighi ike n'ebe unu nọ, kama Ọ di ike nime unu:


mb͕e ọ di Ya ezi nma ikpughe Ọkpara-Ya nimem, ka m'we zisa ozi ọma Ya n'etiti ndi mba ọzọ; ngwa ngwa mu na anu-aru na ọbara ab͕aghi ìzù:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan