Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Habakuk 1:8 - Bible Nso

8 Inyinya-ha nile nwere ukwu nkọ kari agu, ha di kwa nkọ kari anu-ọhia wolf nke anyasi; ndi-inyinya-ha nāwuli kwa elu: e, ndi-inyinya-ha nēsi n'ebe di anya bia; ha nēfe dika ugo nke nēfe ngwa iri ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ. Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị. Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ, ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa. Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Habakuk 1:8
17 Iomraidhean Croise  

Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì: Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.


Ha gēfedakwasi n'ubu ndi Filistia n'Ọdida-anyanwu; ha abua gādi n'otù luta ihe umu Iru-anyanwu n'agha: n'aru Edom na Moab ka ha ganēseti aka-ha; umu Amon ganānu kwa olu-ha.


Le, dika igwe-oji ka ọ nārigota, ọ bu kwa dika oké ifufe ka ub͕ọ-ala-ya nile di: inyinya-ya nile di garagara kari ugo. Ahuhu gādiri ayi! n'ihi na ebibiwo ayi.


N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, dika ugo ka ọ gēfesi ike, b͕asa nkù-ya abua rue Moab.


N'ihi ya ọdum nke sitere n'oké ọhia gētib͕u ha, anu-ọhia wolf nke ala ihe nādighi gēbibi ha, agu ganēche obodo nile ha anya, agādọb͕u onye ọ bula nke nāpu nime ha: n'ihi na njehie-ha di ọtutu, ndaghachi-azu nile nke ha di kwa ike.


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ha bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕ọ dika oké osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Babilon.


Ndi nāchu ayi di garagara kari ugo nke elu-igwe: N'elu ugwu nile ka ha churu ayi n'ọku ọku, n'ọzara ka ha chere ayi anwu.


Biko, si ulo nnupu-isi ahu, Ùnu amaghi ihe ihe ndia bu? si, Le, eze Babilon biaruru Jerusalem, were eze-ya, na ndi-isi-ya, me ka ha biakute ya rue Babilon;


si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n'uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar:


O gēji ukwu inyinya-ya nile zọtọ èzí-gi nile: ndi-gi ọ gēji mma-agha b͕u, ogidi nile nke ike-gi gārida n'ala.


Tiye opì-ike n'okpo-ọnu-gi. Dika ugo ka ọ nābia megide ulo Jehova; n'ihi na ha agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, ọ bu kwa iwum ka ha jehieworo megide.


Ọ nēcheta ndi-ebube-ya: ha su ngọngọ n'ojije-ha, me ngwa ijeru mb͕idi obodo, ma edoziwo ihe-nkpuchi ndi nānọchigide ya n'agha.


Ndi-isi-ya n'etiti ya bu ọdum nāb͕ọ uja; ndi-ikpe-ya bu anu-ọhia wolf nke anyasi; ha ekpechaghi ọkpukpu n'ututu.


Ebe ọ bula ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ.


Ha we za, si Ya, Òle ebe, Onye-nwe-ayi? Ọ si ha, Ebe ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ kwa.


Jehova gēsi n'ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bú mba nke i nānughi asusu-ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan