Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Fịlịmọn 1:7 - Bible Nso

7 N'ihi na enwerem ọtutu ọṅù na nkasi-obi n'ihi ihu-n'anya-gi, n'ihi na obi ndi nsọ ezuwo ike site n'aka-gi, nwa-nnam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Fịlịmọn 1:7
11 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.


N'ihi nka akasiwo ayi obi: ma na nkasi-obi-ayi ayi ṅuribigara ókè nke-uku kari n'ihi ọṅù Taitọs, n'ihi na emewo ka mọ-ya zuru ike site n'ebe unu nile nọ.


Nkwuwa-okwum di uku, bú nke m'ji agwa unu okwu, inya-isim n'ihi unu di uku: nkasi-obi ezuwo ezu nimem, anamaṅuribiga ókè kari na nkpab͕u-ayi nile.


ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n'ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi;


Ọ bu kwa n'ihi nka ka ayi onwe-ayi nēkele kwa Chineke nēwepughi aka, na, mb͕e unu natara okwu nke unu nuru n'ọnu-ayi, bú okwu nke Chineke, ọ bughi okwu madu ka unu nara nke-ọma, kama, otú ọ di n'ezi-okwu, ọ bu okwu Chineke, nke nālusi kwa ọlu ike nime unu ndi kwere ekwe.


N'ihi na gini bu olile-anya-ayi, ma-ọbu ọṅù-ayi, ma-ọbu okpu-eze nke inya-isi ayi? Ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu, n'iru Onye-nwe-ayi Jisus n'ọbibia-Ya?


N'ihi na ekele gini ka ayi puru inyeghachi Chineke bayere unu, n'ọṅù nile ayi ji ṅuria n'ihi unu n'iru Chineke-ayi;


Ka Onye-nwe-ayi mere èzí-na-ulo Ọnisifọrọs ebere: n'ihi na o mere ka m'nwe ume ndu ọtutu mb͕e, ihere nkpọrọm emeghi kwa ya;


E, nwa-nnam, kwe ka mu onwem nwe obi-utọ n'aru gi nime Onye-nwe-ayi: me ka obim zuru ike nime Kraist.


Anamaṅuri ọṅu nke-uku na ahuwom ufọdu n'etiti umu-gi ka ha nējeghari nime ezi-okwu, dika ayi natara ihe enyere n'iwu n'aka Nna-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan