Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Fịlịmọn 1:22 - Bible Nso

22 Ma ọzọ kwa, dozi-kwa-ram ebe m'gānọ dika ọbìa: n'ihi na anamele anya na agēwerem nye unu n'amara site n'ekpere-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ihe ọzọkwa, bụ na m chọrọ ka ị kwadoro m ọnụụlọ ebe m ga-anọ dị ka ọbịa ma m bịa, maka enwere m olileanya na a ga-aza ekpere unu ime ka m si nʼebe a pụta bịakwute unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Fịlịmọn 1:22
13 Iomraidhean Croise  

si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n'iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n'ub͕ọ.


Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n'ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n'ihe bayere Jisus, site n'iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n'ututu rue anyasi.


mb͕e ọ bula m'gāga Spain (n'ihi na anamele anya na m'gēkiri unu mb͕e m'nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n'ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n'aru unu n'akuku ufọdu)


ebe unu nēyekọ kwa aka n'ihi ayi n'aririọ-unu; ka ọtutu madu we kele ekele n'ihi ayi bayere onyinye-amara enyeworo ayi site n'aka ọtutu madu.


N'ihi na amataram na nka gēme ka m'nwe nzọputa, site n'aririọ-unu na nnyezu nke Mọ nke Jisus Kraist,


ma anamatukwasi obim nime Onye-nwe-ayi na mu onwem gābia kwa ọsọsọ.


Ma anamariọbiga unu ókè kari ime nka, ka ewe werem nyeghachi unu ọsọsọ kari.


Maranu na arapuwo nwa-nna-ayi Timọti ka ọ la; ọ buru kwa na ọ gābia na mb͕e ntà, mu na Ya gāhu unu anya.


Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.


Ebe m'nwere ọtutu ihe idegara unu n'akwukwọ, ezubeghm iwere akwukwọ na ink de ha: kama anamele anya na m'gābiaru unu aru, were kwa ọnu gwa unu okwu, ka ewe mezu ọṅù-unu.


ma anamele anya ihu gi ngwa ngwa, ayi gēwere kwa ọnu kwurita okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan