Devid we si Abishai, si kwa ndi-orù-ya nile, Le nwam, nke siri n'afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ò gēsi kwa aṅa ghara ichọkari ya ub͕u a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n'ihi na Jehova siworo ya, Kọcha.
Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M'nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n'ihi na ka mb͕e ra M'nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n'ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n'aru ya ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu.
O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n'ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n'aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n'olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku.
Mb͕e nwa-nne-gi nwoke, bú nwa nke nne-gi, ma-ọbu nwa-gi nwoke, ma-ọbu nwa-gi nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyì-gi, nke di ka nkpuru-obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, Ka ayi je fè chi ọzọ, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha, gi onwe-gi, ma-ọbu nna-gi-hà;