Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Fịlịmọn 1:1 - Bible Nso

1 Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus, na Timọti nwa-nna-ayi nēdegara Failimon akwukwọ, bú onye ayi huru n'anya, onye ayi na ya nālukọ kwa ọlu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Pọl, onye e tinyere nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na site nʼaka nwanna anyị Timoti, Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Fịlịmọn.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Fịlịmọn 1:1
18 Iomraidhean Croise  

O we biaru kwa Dabe na Listra: ma le, otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ n'ebe ahu, aha-ya bu Timọti, nwa nke otù nwanyi Ju onye kwere na Jisus; ma nna-ya bu onye-Grik.


N'ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu.


Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, ha na ndi nsọ nile ndi nọ n'Akaia dum:


N'ihi na unu nile bu umu Chineke, site n'okwukwe, nime Kraist Jisus.


N'ihi nka mu onwem Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus n'ihi unu ndi mba ọzọ,


Ya mere mu onwem, bú onye-nkpọrọ nime Onye-nwe-ayi, nāriọ unu ka unu jegharia dika o kwesiri ọkpukpọ nke akpọrọ unu,


nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu.


Pọl na Timọti, ndi-orù nke Kraist Jisus, nēdegara ndi nsọ nile nime Kraist Jisus ndi nọ na Filipai akwukwọ, ha na ndi nēlekọta unu anya na ndi nējere unu ozi:


Ma anamagu ya ihe di nkpà izigara unu Epafrọdaitọs, bú nwa nna m na onye mu na ya nālukọ ọlu, onye mu na ya nēbukọ kwa agha, onye buru kwa onye-ozi-unu na onye nēfè òfùfè ib͕o nkpàm;


E, ariọkwam gi, onye ekekọtaworo mu na gi n'ezie n'ọlu Chineke, yere ndinyom ahu aka, n'ihi na mu na ha b͕akọsiri nb͕a ike n'ozi oma, gi na Klement, na ndi fọduru mu na ha nālukọ ọlu, ndi aha-ha di n'akwukwọ nke ndu.


Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi,


Jisus kwa, onye anākpọ Justọs, madu atọ ndia sitere n'obibì-úgwù: nání ndia bu ndi sorom nālukọ ọlu n'ikwusa ala-eze Chineke, madu ndi emere ka ha burum ndi-ngugù-obi.


ayi we ziga Timọti, nwa-nna-ayi na onye nējere Chineke ozi n'ozi ọma nke Kraist, ka o we me ka unu guzosie ike, ka o we kasi kwa unu obi n'ihi okwukwe-unu;


Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ:


Ya mere ka ihere àmà nke Onye-nwe-ayi, ma-ọbu ihere nke mu onye-nkpọrọ-Ya, ghara ime gi: kama so ozi ọma Ya hujukọ anya dika ike nke Chineke si di;


Epafras, onye adọkọro mu na ya n'agha nime Kraist Jisus, nēkele gi;


ọ bu kwa otú a Mak na Aristakọs na Dimas na Luk, bú ndi mu na ha nālukọ ọlu, nēkele unu.


ma n'ihi ihu-n'anya ahu ọ kam nma iriọ aririọ, ebe m'bu nání aha madu dika Pọl, bú agadi, buru kwa onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus ub͕u a:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan